Sierra Leone emeela onye Nigeria onyeisi ọrụ gbanụgbanụ maka korona
A HỌPỤTALA dibia oyibo onye Nigeria dịka onyeisi ọrụ gbanụgbanụmaka ọrịa korona (COVID-19 task force) na Sierra Leone.Odogwu nwoke ahụ aha yabụ Dọkịnta Laoluwa Adejayan ka e kwuru na e nyere ya nnukwu ọkwa ahụ ka hatubechara ya ugo dịka dibia oyibo si mba ọzọ kacha eme nke ọma. Dịka ha mere nke ahụha bulikwara ụgwọ ọnwa ya elu, nke pụtara na ọ na-erizi akatampo ego dị $20,000ọnwa ọ bụla. Adejayan gụrụ akwụkwọma turu ugo mmụta na Ladoke Akintola University, Ogbomoso, steeti Oyo. Ọ rụrụ ọrụ obere ogena steeti Bayelsa ka o fechara ala nna ya National Youth Service Corps (NYSC)tupu ọ tụgharịa ọkpa egwu site n’ịga mba ahụ nke dị na West Africa site n’amụmaa kpọrọ Technical Aids Corps Scheme n’afọ 2012. Onyeisiala mba ahụ bụPresident Julius Maada Bio kwuputara n’ezie nhọpụta Adejayan n’akwụkwọ ozi letao zigaara onyeisiala Nigeria bụ President Muhammadu Buhari. Bio kọwara nwa amadiNigeria ahụ dịka onye na-egosipụta ịma mma obodo ya, ezigbo nwa afọ Nigeria. Ọgara n’ihu kwuo na ọ bụ o