Posts

Showing posts with the label Lagos

E jidela onye nta akụkọ dara iwu okporoụzọ na Lagos, daa ya nha

ONYE nta akụkọ Rufai Oseni adaala iwu okporoụzọ na Lagos oge ọ na-eme njem.   Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Benjamin Hundeyin na odeakwụkwọ mgbasaozi nyégárá aka na-achị steeti ahụ, bụ Gboyega Akosile bụ ha kwupụtara nke a.   N’okwu ya banyere nke ahụ, Oseni kọwara na a tụdoro ya egbe ma buru ụgbọala ya.   Ọ sị, “Onye uweojii ala Nigeria tụdoro m egbe, nara m igodo ụgbọala m ma buru ya gbapụ ọsọ.”   Oge ọ na-akọwa ka ya bụ ihe siri mee, Hundeyin kọwara na Rufai dàrà iwu ịgafe nkeji ụzọ BRT ma kwuo na a ga-ata onye uweojii ahụ ahụhụ maka ịtụdo ya egbe.   Ọ sịrị, “Maazị Rufai Oseni bịara ụlọ ikpe taa. A mara ya ikpe ịda iwu okporoụzọ Steeti Lagos nke ahọ 2018. Ọ kwụrụ naanị puku naịra iri asaa tupu e bunye ya ụgbọala ya.”

Mmadụ ise anwụọla oge gaasị gbọwara na Lagos

Ọ BỤ nnukwu ihe ịgba anya mmiri na iru uju na Mushin dị na mpaghara Ladipo nke steeti Lagos oge ite ikuku mmụọ bụ gaasị gbowara ma gbuo mmadụ ise, merụọ mmadụ ruru iri na ise ahụ ma bibìsiekwa ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ n’ebe ahụ.   Ya bụ ajọ ọdachi bụ nke dapụtara oge o jiri nkeji iri na ise gata elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọchị Tuzdee ma bụrụkwa nke wetere ọnwụ ụfọdụ ndị o metụtara ozigbo ozigbo ahụ, bibikwa ihe gburu ego ruru nde kwuru nde naịra na gburugburu ebe ahụ o mere.   N’okwu ya banyere nke ahụ, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ‘National Emergency Management Agency (NEMA), bụ Maazị Ibrahim Farinloye kwuru na ihe ahụ mere n’eziokwu, ma kọwaa na o mere n’ala ebe dị obosara, bụkwa ebe a e jigasịrị osisi wee kụọ ọkpọkọrọ ụlọahịa ebe a na-edebe, ere gaasị e ji esi nri.   Otu onye ọnọmgbeomere, bụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya, kọwara na onye nwe ebe ahụ a na-ere gaasị so n’otu n’ime ndị nwụrụ oge ihe ahụ mere, ma kọwaa na nwoke ahụ na-agbanye gaasị n’ite gaasị dịgasị n’ime ọdụ ahịa ya ahụ ek

Na Lagos, ụmụnwaanyị Ọhaneze Ndigbo emegheela ụlọ ọrụaka, bupụta egwu ọfuu

ỌHANEZE Ndigbo ngalaba ụmụnwaanyị na steeti Lagos, nsonso a agbapeela ebe ihe òmùmù ọrụaka (skill acquisition centre).  Ha nọkwa na ya buputa egwu nke a kpọrọ Ọpụrụiche Dance – Egwu pụrụ iche nke a haziri iji wee weta ịdịnotu, ịhụnanya na nnagide n’ebe ma ndị Igbo nọ na Lagos tinyekwara ndị bi na mba ọzọ nọ.   Egwu Igbo ahụ pụrụ iche bụkwa iji gosipụta  omenala Ndigbo ma bụrụkwa nke a nọ na ya  kwanyere ụmụ ha ndị nwoke na nwaanyị na-eme nkeọma ugwu.   N’okwu ya ka ọ na-akọwa banyere egwu Ọpụrụiche, onyendu ụmụnwaanyị ahụ na steeti Lagos, Oriakụ Violet Uche Obiora kwuru na ụlọọrụ ahụ ebe a na-amụ ọrụaka bụ iji mee ka ụmụnwaanyị  banye n’ụzọ ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha.   Ndị ọnụ ruru n’okwu bịara emume ahụ gụnyere Ifeanyi Ubah, Godwin Ezeilo, Obu Nanka; Oriakụ Folashade Tinubu-Ojo, Iyaloja General nke Lagos; Chiifu Solomon Ogbonna na Ọkammụta Virgy Onyene na ndị ọzọ.   Obiora kọwara na ya bụ àmùmà ụlọ ọrụaka dị oke mkpa n’ihi na ọtụtụ ụmụnwaanyị enweghị ọrụ, ma nọrọ nkịtị. Ọ gara n’ihu

Na Lagos, ndị uweojii ejidela Sajenti gburu Inspektọ

ONYE uweojii nke nọ na Special Protocol Command Unit nkesteeti Lagos aha ya bụ Sergent Okema Azuquo a sụgbuola lnspector AdekunleIlesanmi Francis. Ọdachi a dapụtara n’Oke-Ado dị na steeti ahụ.   Azuquo sụrụ Francismma n’ụlọ ebe obibi ha (rented apartment) nke mere na ọ nwụrụ ka ọ nọchara abalịolemole n’ụlọọgwụ.   A kọwara na nsogbudapụtara dịka Azuquo ṅụchara mmanya o wee gbuwe ya; ka ọ lọtara o buuru mma chụbaotu nwoke bi n’ebe ahụ ọsọ nke mere ka Francis pụta gbochibe ya. N’ihi iwe naonye o ji mma achụ agbapụla n’ihi Francis, ọ wakpoziri Francis gbuo ya mmaugboro ugboro. E bugara Francis ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ n’ụtụtụ Mọnde ka ọgachara abalị olemole.   Otu onye agbataobiachọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị: ” Onye uweojii ahụ bụ Azuquo bụ nnukwunsogbu nye ndị niile bi n’ogbe a, ọ kachasị anyị bụ ndị ha na ya bi n’ụlọ.Ọ bụFrancis bụ onye na-egbochi ya.Ugbu a a nwụchikọrọ ya n’ihi na o gburu onye otuya, ana m eche na anyị ga-enwe udo n’ogbe anyị.”