Ụlọọrụ LGSC emechiela ahọ, were onyinye nkwanye ugwu jaa ndịọrụ ike
ỤLỌỌRỤ Local Government Service Commission (LGSC), Awka, steeti Anambra emeela emume iji kelee ndịọrụ ha mere nke ọma n’afọ 2019/2020. Emume ahụ nke a nọrọ n’ogige ụlọọrụ ahụ mee kpọkọbara ndị otu ahụ, ndị nlekọta na ndị ndu ha niile. N’okwu mmalite ya, onyeisi ụlọọrụ ahụ LGSC Awka bụ Dọkịnta P.U Egenti kọwara na iti ndị ọrụ aka n’obi bụ ezi usoro e ji achị ọchịchị iji wee na-ewulite mmụọ ndị ọrụ.O kwuru tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ sị na ọ bụ nnyocha otu ndịọrụ si arụ ọrụ n’okpuru ọchịchị ime obodo nke steeti Anambra. Ọ kọwara na a họpụtara ndị ahụ e nyere onyinye nkwanye ugwu site na mbọ ha idebe iwu na-achịkwa ọrụ ha, tinyere ụtụ dị iche iche ha tụnyere iji kwalite ụlọọrụ ahụ ka ndịọrụ na-agba mbọ nke ukwu ma na-atụnye ụtụ n’ọrụ karịa, nke ga-enye aka weta ịda mba n’ọrụ n’isi njedebe. Dọkịnta Egenti gara n’ihu kwuo sị: “Dịka a na-akwụba mmadụ iri anọ na iteghete gbara mbọ karịa, ka a na-akwụbakwa ndị ọzọ gbara mbọ n’ụzọ pụrụ iche.” Ya mere, o tokwara ndị ahụ gbara mbọ pụrụ iche