Posts

Showing posts with the label Kwara

Na Kwara, ndị uweojii ejidela mmadụ abụọ bu isi na aka mmadụ n'akpa

NDỊ uweojii steeti Kwara anwụchikọọla mmadụ abụọ bu isi na aka mmadụ a ka gburu ọhụrụ n’ime akpa. Ọ bụ n’ogologo ụzọ Oke-Oyi/Jebba ka ya bụ ihe mere.   Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ SP Okasanmi Ajayi bụ ya mere ka ụwa mara nke a, ma kwuo na oge ndị uweojii na-agba ha ajụjụ, mmadụ abụọ ahụ kpara arụ, Wasiu Omonose  gbara afọ iri atọ na ise na Akibi Ibrahim gbara afọ iri atọ na abụọ kwuru na ha na-ebugara otu ‘Alfa’ nọ n’Ilorin akụkụ ahụ ndị ahụ maka iji ha gwọọ ọgwụ.   O kwuru sị na ọ bụ ka ndị uweojii Kwara na-agba mbọ ikwochapụ arụrụala na steeti ahụ ka ndị uweojii nọ na ngalaba Operation Harmony jidere ha wee hụ ihe ndị ha bu n’akpa.   Dịka o siri kwuo, mmadụ abụọ ahụ bù ọgbatumtum gbara ọsọ ka ha gbanarị ndị uweojii, ma ha chụrụ ha ọsọ, wee jide ha.   N’okwu ya banyere nke ahụ, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Tuesday Assayomo, dọ̀rọ̀ ndị arụrụala niile aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n’ofe ma makwaa ọkwa na onye ọbụla e jidere ga-agba

Na Kwara, ndị uweojii ejidela onye ọgwụego bu isi na aka mmadụ eme njem

IGBO sị na ajọ ihe na ezi ihe agaghị agwụ agwụ n’ụwa; ma sịkwa na ọ bụ njọ ka a ka anụ, maka na ndị ọjọọ karịrị ndị ezi mmadụ.   Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii na steeti Kwara anwụchiela otu nwoke bụ Maazị Kehinde Moses ka o bukọsị isi na aka mmadụ n’àkpà wee na-eme njèm, isi na mpaghara Ajase-Ipo nke steeti ahụ wee gaa Illorin, bụ isi obodo steeti ahụ.   Ya bụ nwatanwoke gbárá ahọ iri abụọ na anọ ka e kwuru na o kechisiri isi na aka mmadụ ahụ ike ma fọnye ya n’akpà, nke na ọ gaghị adịrị onye ọbụla mfe ịma na ọ bụ akụkụ ahụ mmadụ ka o bu n’akpa.   Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Ajayi Okasanmi siri kọwaa, onye ya na nwoke ahụ so were abagide na njem ọjọọ ahụ (bụ onye òtù ya) rìrì mbọmbọ ọsọ ngwangwa ndị uweojii kwụsịrị ụgbọala Bọọsụ ahụ ha nọ na ya n’okporoụzọ ka ha nyochaa ya; e wee nwụchikọọ naanị ya onwe ya.   Kaosiladị, mgbe ndị ahụ malitezịrị inyocha ụgbọala ahụ na onye ọbụla nọ n’ime ya, a hụrụ àkpà ahụ Moses bu, wee meghee ya, wee hụ