Posts

Showing posts with the label Kurt Zouma

Ụlọikpe amala ọgba bọọlụ Zouma ikpe maka ịma nwamba ya ụra, gbaa ya ụkwụ

A MACHIELA otu nwoke aha ya bụ Kurt Zouma ịzụ nwamba (cat) malite ugbua ruo ahọ ise na-abịa abịa, ma nyekwa ya iwu ịrụ ọrụ obodo otu narị awa na iri iteghete, dịka ntaramahụhụ, maka ịgba nwamba ya ụkwụ na ịma ya ụra, bụ nke a hụtara n’onyoonyoo ebe o mere ya.  Ya bụ nwoke ọgba bọọlụ a maara nke ọma na mba France bụ̀ onye a mara ikpe ahụ n’ụlọikpe Majie dị na mpaghara Thames, bụ ‘Thames Magistrates Court’, ma bụrụkwa nke a mara ya ma nyekwa ya ntaramahụhụ so ya oge o kwetechara na o mere ihe ahụ n’eziokwu, bụ ịta anụmanụ ahụhụ n’ekwesịghị ekwesị ma bụrụkwa nke adabaghị adaba n’usoro iwu.  Ọ bụ nwanne ọgba bọọlụ ahụ sere ya n’onyoonyoo ebe o mere ya bụ ihe nà etu o siri mee. Zouma kwetere na ya mere ihe ahụ n’ezie ma gwakwa ụlọikpe na o mere ya maka na nwamba ahụ mebiri oche ya.  Na nkabi ikpe ya Ọkaikpe Susan Holdham kọwara agwa ahụ dịka nke jọgburu onwe ya.    Ọ sị ya: “Nwamba ahụ lere gị anya ka i gbooro ya mkpa dịịrị ya ụbọchị ahụ, ma i gboroghị ya mkpa ya, kama ị tara ya ahụhụ ekwes