Posts

Showing posts with the label Kogi

Na Kogi, ehi iri abụọ anwụọla ka ha tachara ahịhịa

Ọ BỤ ihe mgbagwoju anya ka ehi dị iri abụọ n’ọnụọgụ si nwụọ pịị na ntụmadị, ozugbo ha tachara ahịhịa na Lokoja,  steeti Kogi.  O nweghị onye nwere ike ịkọwa ihe mere ehi ndị ahụ jiri nwụ, ma ndị  mmadụ na-ekwu na ọ bụ nsi (poison) ka e nyere ha.   Ya mere, n’ihi ya bụ ihe nke mere n’izuụka gara aga, gọọmenti steeti Kogi dọrọ ndị nke ya aka na ntị ka ha zeere ịta anụ ehi  otu izuụka.  Onyeisi, Veterinary Services steeti ahụ, Dọkịnta Salau Tarawa oge ọ na-enye ndụmọdụ ahụ n’izuụka gara aga kwuru na ka ha nwetachara mkpesa ahụ, na ndị ọrụ ha zọpụrụ njem ozigbo ma bukọrọ ụfọdụ anụ ehi ndị ahụ e nwetara n’ahịa. Ọ rụtụrụ aka ma sị na e kwuru na e burula ehi ndị ọzọ gaa Osara, Ajaokuta, Obajana, Kotonkarfe  na Kakanda, ka e resi ha ọha na eze amaghị ihe merenụ.  Otu o sila dị, ọ gara n’ihu kọwaa na ministịrị na-ahụ maka ọrụugbo na ndị ọrụ nchekwa akpọọla ndị na-achị ehi (herders) okwu ahụ gbasara oku maka ịgba ha ajụjụ, tinyere ụzọ a ga-esi kwọ onye ukwu wara.  N’akụkụ nke ya, Odeakwụkwọ Ọkpụ

Na Kogi, ndị nta ejidela ndị omekoome anọ

IGBO sị na agbataobi onye bụ onye nche ya.   N’ịgbasò nke a, ndị na-achụ nta n’okpuru ọchịchị Okehi nke steeti Kogi nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ mmadụ anọ, bụ ndị omekoome na-eyi ndị na-anyà ụgbọala égwù ma na-emekpàkwa ha ahụ na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Okene gaa Lokoja na steeti ahụ.   Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ọnụ odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ steeti ahụ, bụ Maazị Onogwu Mohammed, bụ onye kwuputàrà ya site n’ozi ọ kụpụrụ n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ Facebook ya.   O mere ka a mara na ndị nta ahụ nọkwara n’abalị ahụ wee bibie ọhịa ebe ha jiri mere ugbo ebe a na-akọpụta ìgbó, bụ nke ndị omekoome ahụ nwe, ma bụrụkwa ebe ha na-emepta ọgwụ ike dị iche iche.   Dịka o siri kọwaa, ndị omekoome ahụ nwèkwàrà ụdị nkịta pụrụ iche ha na-azụ n’ebe ahụ maka ịtàgbù na ịchụpụ onye ọbụla tinyere ụkwụ ebe ahụ maọbụ wakpo ha n’ebe ahụ.   Ọ gara n’ihụ kọwaa na oge ndị nta ahụ wakpòrò ebe ahụ, na ha nwụchikọrọ mmadụ anọ n’ime mmadụ ndị omekoome iri nọ n’ebe ahụ, ma gbuo nkịta is

Na Kogi, Pastọ egbuola onye ashawo lie akụkụ ahụ ya n'alta ụlọụka ya

AKA akparala otu Pastọ aha ya bụ Segun na steeti Kogi maka igbu otu nwaanyị ji ahụ ya akpa ego aha ya bụ Mercy Moses.   Pastọ ahụ nke ụlọụka Celestine Church Ozuri nke dị n’okpuru ọchịchị Adavi na steeti Kogi ka e kwuru na o zipụrụ ndị ụka ya abụọ ka ka kpọta nwata nwaanyị ọ ga-eji gwọ ọgwụ. Ya mere, ha kpọtara nwaanyị ahụ site n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ Hollywood Hotel dịkwa n’Advani. Ndị ahụ, Mike na Stephen kwuru na Pastọ kwere ha nkwa ịkwụ ha puku narị naịra asaa.   E kwuru na ha gburu onye ashawo ahụ, bere isi, ara, ụkwụ abụọ, na otu aka ya lie ha n’alta ụlọụka ahụ; buruzie ozu ya fọrọ afọ lie n’ọhịa.   Ya mere ka e jidechara ha, ha kpọọrọ ndị uweojii gaa Uhodo dị n’Ogaminana n’Adavi ebe ha liri ozu ya, ebe a nọrọ bọpụta ya.   N’akụkụ nke ya, Mercy Moses  onye e gburu egbu bụ onye Tiv hapụrụ steeti Benue bịa Kogi maka ịrụ ọrụ.   Otu o sila dị, ndị uweojii mara imi n’ala wee nwụchikọọ Pastọ ahụ onye dị na mbụ rie mbọmbọ ka ọ nụrụ na a nwụchikọọla ndị ọrụ ya, ma dọnye ozu n’ọba ozu Okene