N’Awka, Knight St Mulumba, Madonna Mercy ekeela ndị ogbenye ihe enyemaka
NDỊ òtù Knights of St Mulumba nke St Thomas Aquinas Catholic Church, G.R.A, Awka nọ ụbọchị ụka site na njikọaka nke ndị òtù Madonna Mercy leta ma nye ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nkwado dị egwu. Ọ bụ n’ogige ụlọụka Aquinas ka ha nọrọ were mee emume ịhụnanya ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị nwere nkwaru si Oji River na steeti Enugu na mpaghara ndị ọzọ dị iche iche were bịa. Ụkọchukwu kara ụka elekere iteghete na ọkara ụbọchị ahụ bụ Fada Emmanuel Umezinwa toro ndị kpuru isi mmadụ abụọ gụrụ ihe ọgụgụ maka mbọ ha, dịka o kelere ndị òtù Knight St Mulumba maka ịhazi ọgbakọ ahụ. N’okwu ya oge a nọ na mmemme ahụ, ụkọchukwu parish bụ Fada Francis Oranye kwuru sị na ha na-enwe mmasị n’ihe gbasara ndị ụwa na-atụ n’ọnụ. O kwuru sị na Kraist meere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ebere, na ndị ụka na emekwa, ma rụtụkwa aka n’òtù Madonna Mercy. O kelere ndị chịkọbara emume ahụ ma kọwaa na ọ bụ mmụọ Chineke nọ n’ime ha mere ka ha na-arụ ọrụ ebere. O kwuru sị: “Kraist kwuru sị nyenụ ha ihe ka ha rie.” Ya mere, o k