Posts

Showing posts with the label Kenneth Dike

Ọbà akwụkwọ Kenneth Dike emeela ncheta ụbọchị akwụkwọ na mba ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ ndị   ỤLỌ ezumezu nke ọbá akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka juputara nnọọ gbịm gbịm n’ọńụ dịka igwe mmadụ sitere n’ebe dị iche iche bịara isonye na mmemme ncheta ụbọchị akwụkwọ na mba ụwa, nke afọ 2018.   Oke mmemme ahụ bụ nke a chịkọbara site n’aka ọba akwụkwọ steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ihe karịrị ìgwè mmadụ karịrị narị ise n’ọnụ ọgụgụ, ndị gụnyere ndị nkụzi, ụmụ akwụkwụ, ndị ntorobịa, ndị nne na nna, ndị ọrụ gọọmenti, ndị selitere isi na ngalaba mmụta, ndị ode akwụkwọ, ndị ọrụ mgbasa ozi, tinyere ndị ọzọ dị iche iche hụrụ odide na ọgụgụ n’anya.   N’ozi nnọọ ya, onye jigodi ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ ahụ, bụ Nwada Nkechi Udenze kọwara ụbọchị ahụ, bụ abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa April afọ ọbụla dịka ụbọchị ndị otu UNESCO weputara maka iji merube ma gosipụta ịma mma nke akwụkwọ na oke uru dị iche iche akwụkwọ bara na ndụ mmadụ. Ọ kọwara akwụkwọ dịka ihe onwunwe dị oke ọnụ ahịa nakwa ihe ụtọ nke na-adịgide, ma kpọkuzie ụmụ akwụkwọ na ndị ọzọ nd