Posts

Showing posts with the label Kelvin Odenigbo

Odenigbo nwụrụ ọnwụ mberede – FC Vitebsk

OTU egwu bọọlụ, Belarus Premier League, FC Vitebsk ekwuputala na ọnwụ onye Nigeria ahụ na-agba bọọlụ mmiri riri, Kelvin Odenigbo, bụ n’ihi ihe mberede.   N’ozi ha ka òtù  ahụ nọrọ kọwaa sị: “Site na nnyocha e mere, a chọpụtara na ya bụ onye ọgba bọọlụ enweghị mmerụ ahụ ọbụla, o nweghị ihe gbasara mmanya na-aba n’anya (alcohol) n’ọbara ya. Ọ bụ ihe mberede – mmiri riri ya, ma bụrụ nke tụrụ anyị n’anya.”   Ka anyị cheta na a gbasara ozi ụbọchị ụka na mmiri riri ya bụ onye na-agba bọọlụ n’otu FC Vitebsk, bụ onye gbara afọ iri abụọ dịka a hụrụ ozu ya n’ọdọ mmiri (lake) dị na Belarus, ka ọnwa Juunu dị n’abalị ise.   Otu o sila dị, kụlọọbụ ahụ gara n’ihu kpọkuo ndị hụrụ ha n’anya (fans) ka ha bịa sọpụrụ onye ọ gba bọọlụ ahụ lara mmụọ n’amaegwuregwu FC Vitebsk, ebe a hazigoro ọnọdụ, nke gụnyere foto ya bụ nwa lara mmụọ, okooko, tinyere akwa e ji agba bọọlụ, nọmba 2 jesi, nke onye egwu bọọlụ ahụ na-eyi.   Odenigbo sitere na NAF Rockets FC nke Nigerian National League, ebe ọ gbagoro bọọlụ afọ a