Ndị uweojii ejidela nwaanyị tọọrọ nwa a mụrụ ọhụrụ na Jos
NDỊ uweojii anwụchikọọla otu nwaanyị tọọrọ nwa a mụrụ ọhụrụ na Jos, isi obodo steeti Plateau. Nwaanyị ahụ aha ya bụ Oriakụ Lerishimwa Diyal, gbara afọ iri atọ na abụọ zuuru nwa ọhụrụ ahụ ka ọ gachara abalị atọ nne ya bụ Oriakụ Mary Chukwuebuka mụchara ya n’ụlọọgwụ ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’. Diyal (nwaanyị zuru ohi nwa) yiiri akwa njirimara ndị ọlụ ahụike wee bata n’ụlọọgwụ ahụ nara nwata ahụ n’aka nne ya n’ụdị na ọ bụ onye ọlụ ebe ahụ na ọ chọrọ ikuru ya gaa mịrị ya ọbara maka nnyocha. Otu ahụ ka o siri zuru nwata ahụ wee gbapụ ọsọ gaba n’ụlọọgwụ ọzọ ‘Bingham University Teaching Hospital, Jos’ ebe ọ gwara ha na ndị ntọrị (kidnappers) tọọrọ ya, ọ nọrọ ebe ahụ mụọ nwa ka di ya nyechara ha ego dịka ha siri chọ. Ụlọọgwụ ebe nke a bụ ebe e kwuru na nne ya na-alụ ọlụ dịka nọọsụ. Otu o sila dị, a nwụchikọrọ ya site n’ịma imi n’ala nke ndị uweojii ka e nwetachara ozi na a na-achọ nwa ọhụrụ a mụrụ na ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’ achọ. Ka e mechara nnyocha, ilele ọbara ụmụnwaanyị