Posts

Showing posts with the label Ji abana na abụbọ

Nri ndị Igbo: Ji abana na abụbọ

ABANA bụ otu nri ndị Igbo ụfọdụ chefugoro taa mana abanamara mma nke ukwuu. Abana bụkwa ọgwụ nye ụfọdụ ọrịa dị ugbu a. Ọ dị onye ọbụlanwere ọrịa mamịrị (diabetes), ọ bụ abana ka a na-asị ya ribe, maka na onweghịshuga.   Ọ dị ụzọ abụọ e sieri abana. Oge abana ji atọ ụtọ bụ oge ọkọchị, mgbe ahụ mmiri amịkọchalan’abana. I sichaa abana, i were mmanụ suru ya, maọbụ i mee abụbọ were suru ya.Ihe e ji eme abụbọ bụ nke a: akwụkwọ ụgụ, akwụkwọ inine, akwụkwọ onugbu. I sieya n’ọkụ, o ghee, ị sụọ ya n’ikwe, tinye ụkpaka, mmanụ, ose, nnu, ị sụkọọ haniile ọnụ. I tinye ya mmiri dị ńara ńara, ị kwọkọọ ha ọnụ, werezie ya surubeabana ahụ.