Posts

Showing posts with the label JDPC

Bishọp Ezeokafor enyela igwe mmadụ nkwado site n'otu JDPC

OTU ịhụnanya a kpọrọ Justice, Development and Peace Caritas (JDPC) enyela ndị onweghị ka ọ ha dị iri atọ na ise n’ọnụọgụ nkwado. E nyere mmadụ iri na otu onyinye igwe e ji akwa akwa (sewing matchine), ma nye ndị ọzọ onyinye ego karịrị nde naịra abụọ.   Ọ bụ n’obi Chukwu, St Patrick’s Cathedral, Awka, ka a nọrọ mee emume ahụ. Bishọp ụka katọlik dayọsis nke Awka, Most Rev Paulinus Ezeokafor toro ndị JDPC maka ezi mbọ ha na agba, dịka ọ gwara ndị ahụ ritere onyinye amara ndị ahụ na ọ bụ n’ihi ọrụ ọma ha ka ihe ndị ahụ jiri were ru ha aka.  N’okwu nke ya mgbe a na-ahafe ihe ndị ahụ n’aka ndị mmadụ sitere parish dị iche iche, Chanselọ dayọsis Awka bụ Fada Charles Ndubisi kpọkuru ha ka ha leruo anya ala ma were ihe ndị ahụ kpọrọ ihe.  Daịrektọ Levi Uko kelere Bishọp tinyere ndị ọzọ; ma kpọkuo parish niile ka ha hibe otu JDPC na parish ha dị iche iche.   N’akụkụ nke ya, otu onye n’ime ndị ritere onyinye ndị ahụ, Rita Nwabueze si Ebenebe kelere Bishọp Ezeokafor ma dụkwaa ndị niile e nyere ha n

Ụka ga-enyenwuru ndị ụka aka nweta ọrụ, nkwado – Nnabuife

ONYEISI ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLight Xtra na Homeland, Sir Chuka Nnabuife akpọkuola ụka ka ha wepụtara ndị nke ha ohere inwe ọrụ.   Nnabuife kwuputara nke a na nkuzi o nyere n’ọgbakọ  Izuụka Justice, Peace and Development Commission (JDPC week) n’ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church, G.R.A, Awka, nke isiokwu ya bụ: ukọ ọrụ dịka ihe butere enweghị ezi nchekwa n’oge ihe iche aka mgba korona; ọrụ ụka kwesịrị ịrụ (Unemployment as a catalyst for insecurity in a COVID-19 pandemic era: The role of the church).   Nnabuife kọwara nsogbu korona dịka nke jezuru ụwa niile ma bụrụ nke butere oke ihe iche aka mgba; ma wete ịkpa oke n’ebe mmadụ na ibe ya nọ nke na ndị nọ n’otu ezinaụlọ malitere ịsọ onwe ha asọ. Ọ chetaara ndị mmadụ otu nsogbu ahụ siri ruo ụlọụka nke na e mechiri ụlọụka ma gwa ndị mmadụ ka ha nọrọ n’ụlọ na-ekpere chi ha.   Ọ gara n’ihu rụtụ aka n’Akwụkwọ Nsọ Eph 2:10 ma kwu

JDPC ekesàárálá ndị ihe na-esiri ike nri n'Onitsha

Image
ÒTÙ a maara dịka ‘Justice Development and Peace Commission(JDPC)’ nọrọ na nsonso a wee kesàárá ndị dị iche iche ụwa na-atụ n’ọnụ nri naihe oriri ndị ọzọ dị iche iche iche.   Nke a bụ n’ijimerubè ụbọchị nri na mba ụwa nke ahọ a bụ 2020, ma bụrụkwa nke e mere n’Ọnịtsha,na steeti Anambra.   N’okwu ya banyerenke ahụ, onyeisi JDPC na Achdayọsisi nke Ọnịtsha, bụ Ụkọchukwu Edwin Udoye kọwàranri dịka ihe dị oke mkpà na ndụ mmadụ ọbụla, maka na mmadụ chọrọ nri iji dị ndụma nwekwa ike ime ihe.   Ọ gbarụrụ ihu makwaa arịrị na ọtụtụ ụmụafọ Nigeria enweghịzị nri oriri ugbua, ebe ọtụtụ n’imeha bụkwa ndị ihe na-esiri ike n’ihi etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri dobe imina ọnụ ugbua, ya na etu ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ siri dịzie oke elu ugbua,nke na ọ bụzịkwa naanị ndị ọgaranya nwekwara ike ịzụtanwu nri ugbua.   O mere ka a mara naAchdayọsisi Ọnịtsha na-atụ anya ịzụ mmadụ karịrị puku abụọ na narị abụọ n’ọnụọgụgụnri n’ime mpaghara anọ dị n’Achdayọsisi. O kelekwazịrị Achbishọọpụ ValerianOkeke maka mbọ

N’Omagba Onitsha, ndị Sista emeela ngagharịiwe, katọọ ndị agbatobi na-ahafe nsị n'ọwa mmiri

NDỊ ụka, tinyere ndị bi n’okirikiri Omagba Phase One Layout, Onitsha nke dị na steeti Anambra emeela ngagharịiwe udo n’ihi mmetọ nke megidere ahụike mmadụ site n’aka ndị nweụlọ (landlords) bị n’ebe ahụ. Ndị nweụlọ ka e kwuru na ha na-akwara okporo (pipe) na-ebu nsị wee na-etinye ya isi n’ọwa mmiri n’enweghị ụzọ ọbụla ha si amịpụ nsị ahụ. Ndị chịkọbara ya bụ ngagharịiwe bụ ndị Justice, Development and Peace Caritas (JDPC), archidayọsis nke Onitsha bụ ngalaba na-ekwupuru ndị mmadụ maka ọdị mma ha n’ụka Katọlik. Ha tiri mkpu banyere ahụike ụmụakwụkwọ na ndị ụka Holy Spirit Catholic Church, Omagba bụ ndị nke mmetọ (pollution) ahụ kacha metụta. Ndị bu ụzọ na ngagharịiwe ahụ bụ ndị Sista (Rev Sisters). Ha na ndị mmadụ bucha ihe e dere n’obosara akwụkwọ iji katọọ ihe ọjọọ ahụ. Ha nọ na-agụ, na ekwupụta ihe dị iche iche iji kwado ezi mkpocha, ịmịcha nsị na ịdị ọcha dịka ha na-agagharị n’ogbe ahụ. Ihe ha dere were na-agagharị gụnyere; “Ịhapụ nsị ka ọ na-abanye n’ọwa mmiri bụ njọ megide mmadụ.”