Izuchukwu na Chinyere agbaala nkwụ
ỌŃỤ dara ụbọchị satọdee gara aga dịka ezinaụlọ Maazi naOriakụ Samson Ucheakpunwa na ezinaụlọMaazi Abel Enukorah hafere ụmụ ha Chinyere na Izuchukwu n’alụmdinanwunye. Igba nkwụ ahụ nke ewubere n’obi nna nke nwaanyị n’Umuezeilo, Ovollo, Mbaukwu dị n’okpuru ọchịchịAwka South, dọtara ndị mmadụ siri ebe dị iche iche wee bịa soro ha ṅurịa makelekwaa Chineke. N’okwu ya mgbe ọna-agozi di na nwunye ọhụrụ ahụ, nna nke nwaanyị kpọkuru Olisa bi n’igwe ka ọ gọzieezinaụlọ ọhụrụ ahụ, nye ha akụ na ụba mmaji kwuru mmaji, mkpụrụ nke afọ mahanye ihe niile gbasara ha n’aka Chukwu. Ọ gara n’ihu ịdụ handụmọdụ gbasara alụmdinanwunye, “ọ bụ site n’ịmara Chineke na ekpere ka alụmdinanwunyeji adị mfe. Werenụ nsọpụrụ na ịrube isi mere ihe n’ezinaụlọ ọhụrụ ụnụ. Alụmdinanwunyeụnụ ga-amịta mkpụrụ. Ọ ga-adịrị ụnụ na mma, ma dịkwara ụmụ ụnụ ga-amuta namma”. N’otu aka ahụ, nnenwoke gbara akwụkwọ, Oriakụ D.C. Enukorah kelere Chjkwu maka otu o siri mee iheniile ka ọ gaa nke ọma, ma gosikwa afọ ojuju ya, ịnọ n’