Posts

Showing posts with the label Iyeri nti

Iyeri na ụzọ e si eji ya achọ mma

IYERI bụ otu n’ime ihe e ji achọ mma. Agbụrụ dị iche iche jiya achọ mma dịka obibi ndụ ha siri dị.Ọ na-adị n’ụdị dị iche iche dịka ọlaọcha,ọlaedo, igwe, rọba, akwa w.d.g.   N’ala Igbo, dịkausoro ndụ ha siri dị, ọ bụ ụmụnwaanyị na-akwụ iyeri.Ha na-akwụ iyeri na ntị.N’ihi ya, mgbe ọbụla a mụrụ nwa nwaanyị n’ala Igbo a na-agbapu ya ntị n’egbughịoge ọbụla. N’otu aka ahukwa, agbụrụ dị iche iche gụnyere ndịọcha, Hausa,Yoruba, Fulani na ndị ọzọ niile na-akwụ iyeri mpaghara ahụ dị iche iche dịka,ntị, imi w.d.g.   Ụfọdụ na-akwụ ọtụtụiyeri n’otu oge dịka ha siri chọ. Oge ụfọdụ, ha kwụrụ iyeri n’elu ntị ha akwụrụn’ala yaabụ, n’ebe a kpọpuru a kpọpu.   N’ala Igbo taa, dịkaihe siri gbata kwụrụ, ọtụtụ ụmụnwoke amalitela ịkwụ iyeri nke meziri na ahịaiyeri na-agazi werewere karịa ka ọ dị na mbụ dịka a na-arụpụtazi ya n’ụdị dịiche iche. Ụfọdụ na-ebu ibu, ụfọdọ na-epe mpe, ebe ụfọdụ na-eto ogologo w.d.g.Otu ha siri dị iche iche ka ọnụ ahịa ha si dị iche iche, ma n’ihe niile maogbenye ma ọgaranya na-egot