Ndị Obosi emeela emume Ito Ọgbọ
OMENALA bụ ọbara na-ehù na ndụ àgbụrụ, ma bụrụkwa nwata tote o tokwuru. Nke a bụ nke pụtara ihè n’ozùzuoke, dịka ndị Obosi dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra merùbere emume Ito Ọgbọ, bụ otu nnukwu emume e jiri mara obodo ahụ. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’ogige Afor Adike, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ siri ebe dị icheiche wee bịa isonye na ya. N’okwu nnabata ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala Obosi, bụ Igwe Chidubem Iweka mere ka a mara na a malitere ime emume Ito Ọgbọ Obosi kemgbe ihe karịrị narị ahọ gara, ma bụrụkwa mmemme sitere n’aka ndị nna-nna ha wee rute ha aka. Dịka ọ na-ekwupụta na ọ bụ mmemme ahụ bụ nke kachasị mmemme niile a na-eme n’obodo ahụ, ọ kọwara na mmemme ahụ bụ nke ha ji emerùbe ma na-akwanyere ndị okenye ha ndị rugoro ahọ iri asatọ ùgwù n’ụzọ pụrụ iche, ma mee ka a mara na o nweghị ihe ịgwọ ọgwụ ọjọọ ọbụla maọbụ ikpere arụsị dị na ya bụ mmemme, nke pụtara na onye ọbụla nwere ike isonye na