Ihe ahịa zụrụ ka a na-agba Isita
ỤBỌCHỊ ụka ka ndị otu Kraịst n’ụwa niile na-agba Isita. Ọ bụ oge e ji echeta mbilite n’ọnwụ Onyenwe anyị Jesu Kristi. Ọ bụ nnukwu emume kacha emume niile a na-eme n’ụka. Dịka a na-eji abalị iri anọ mee emume icheta ahụhụ na ọnwụ Kraịst (lent), mgbe nke ahụ gachara, nke bụ oge ekpere na ebumọnụ, a na-abanye n’emume Isita nke bụ oge oriri na ọṅụṅụ. Taa bụ Tọzdee dị asọ, ụbọchị e ji echeta oriri ikpeazụ Onyenweanyị na ụmụazụ ya riri. Echi bụ Ezi Fraịdee, nke bụ kpọmkwem ụbọchị e ji echeta ọnwụ ya n’obe. Ọ bụ ụbọchị ekpere na ebumọnụ n’ụzọ pụrụ iche. Ụbọchị Satọdee dị asọ, a ga-aka ụka abalị n’ụlọụka dị iche iche. Nke ahụ gachaa, abanya ụbọchị ụka bụ Isita. Oriri ụbọchị ahụ bụ onye rikata, o rifọrọ ibe ya. Ụfọdụ na-egbu ehi, ewu, torotoro, ọkụkọ na anụ ndị ọzọ dịka aka ha onye. A na-azụkwara ụmụaka akwa ma akpụkpọụkwụ. Ndị okenye na-azụkwa nke ha. E wepukwa ihe ndị a, Isita na-abụ oge mmemme dị iche iche dịka, ịgba nkwụ, agbamakwụkwọ, ọṅụ nwa, ịkpọghe ụlọ, nzukọ wdg. Ma ka ihe siri