Posts

Showing posts with the label Innoson

Obiano etoola Innoson dịka ọ gbapere ngalaba ọhụrụ, ụgbọala ọhụrụ na Nnewi

KA ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ a mà àma na-emepụta ụgbọala n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Innoson Vehicle Manufacturing Company (IVM) ewepụtala ngalaba ụlọọrụ mmepụta ụdịrị ụgbọala ọhụrụ ọzọ, iji gbakwụnyekwuo n’ụdị ụgbọala ndị ọzọ ọ na-emepụta.   Mmemme ịgbape nke a bụ nke weere ọnọdụ n’Umụdim Nnewi dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi North’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ; Minista na-ahụ maka ego nà amụmà ego ọrụ n’ala Nigeria, bụ Dọkịta Zainab Ahmed na ògbò ya nke na-ahụ maka ụlọọrụ, azụmahịa na iji ego achụ ego, bụ Otunba Adebayo, na ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ.   E wezuga ngalaba mmepụta ụgbọala abụọ ahụ a gbapere ọhụrụ, a nọkwara na ya bụ mmemme gbapee ngalaba mmepụta akụrụngwa na-eme ka mmadụ e ji were agba ihe, bụ nke a kpọrọ ‘Robotic Spraying Booth’, nke ụlọọrụ innoson ahụ.   N’okwu ya n’ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke nọchitere anya ya gbàrà akaebe na ụlọọ