N'Indonesia, agụiyi eloola nwata nwoke dị ahọ asatọ
AGỤIYI (crocodile) eloola nwata nwoke gbara afọ asatọ ka ọ na-egwu mmiri na mpaghara East Kalimantan, Indonesia. Nwata ahụ na obere nwanne ya nwoke na-egwu mmiri n’oshimiri ahụ ebe nna ha si n’akụkụ ụlọ ha na-ele anya oge agụiyi wakporo ya ma loo ya; dịka Oktavianto onye ọrụ n’ụlọọrụ na-ahụ maka ịchọ na ịzọpụta onye nọ na nsogbu (local search and rescue agency) si kwu. Ọ gara n’ihu kwuo sị: “Nna ya wụbara na mmiri ịzọpụta ya mana agụiyi ahụ gbalara. Ọ chụrụ ya ọsọ ma were aka nkịtị kụọ ya ihe mana o jidenwughị ya. Otu o sila dị, ndị ahụ ịchọ ihe dị n’aka mechara n’echi ya jide agụiyi ahụ nke toro ogologo (six-metre-long) ma nweta ozu nwata ahụ n’ozuzu oke n’ime afọ ya. Ha gara n’ihu dọpụta ozu ya n’afọ agụiyi ahụ, ebe ezinaụlọ ya nọ na-ebe akwa. Oktavianto kọwara na a maara oshimiri ahụ dịka nke agụiyi na-ejuputa na ya; mana na ụmụaka ahụ na-agakarị na ya asa ahụ ma na-ekutekwa mmiri e ji esi nri. Nwata ahụ agụiyi loro Ndị ọrụ nchekwa mgbe ha jidechara agụiyi ahụ loro nwata