N’India, mmadụ 25 anwụọla ka ha ńụchara mmanya
NDỊ uweojii mba India ekwuola na opekatampe mmadụ iri abụọ na ise anwụọla n’India, ka ha ńụchara mmanya na-aba n’anya nke nsi (toxic alcohol) dị na ya. Ka ihe siri gbata kwụrụ, ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ iri maka ire mmanya ahụ n’Uttar Pradesh bụ mpaghara kacha ekwo ekwo n’India. Okwuputa okwu ndị uweojii, Ajab Singh gwara ndị ntaakụkọ oge ozi ji ru anyị aka sị: “Ka ọ dị ugbu a, mmadụ iri abụọ na ise anwụọla dịka e bụgara ndị ọzọ ụlọọgwụ ebe ha na-anara ọgwụgwọ. A nwụchikọọla mmadụ iri.” E kwuru na e mechiri ebe ndị a na-ere mmanya na mba India n’ihi oke ike korona na-akpa n’ebe ahụ. Ebe puku kwuru puku mmadụ nwụrụla n’ihi ọrịa ọjọọ ahụ. Ma dịka ihe bidoro belatawa, Uttar Pradesh nabatara ka e bidokwa rebe mmanya n’akụkụ ụfọdụ site na Mee 11, ma nye ntụziaka awa a ga-eji na-ere ya. A na-akọwa na ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ na mba India afọ ọbụla n’ihi mmanya na-aba n’anya dị ọnụ ala nke a na-emebe n’azụụlọ; ma bụrụkwa nke ogbenye ọnụ ntụ ga-egoteli. E kwukwara na ụfọdụ ihe nd