Posts

Showing posts with the label Imo

N'Imo, nwoke ebeela arịrị maka nwa ya nwụrụ n'ihe mbigbọ

KA Ọ gachara izuụka olenaole mmadụ dị otu narị na iri ise n’ọnụọgụ nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba dapụtara n’ebe a na-esucha mmanụ agbidi, nke iwu akwadoghị (illegal refinery) dị n’Abaezi, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ohaji/Egbema na steeti Imo; nna otu n’ime ndị ahụ ọkụ gbagburu, Maazị Uche Okwuodo enwebeghị ike ịghọta ma kwete n’ezie na nwa ya nwoke gbara afọ iri na asaa, Onyekachi Okwuodo, anwụọla pịị ma bụrụkwa onye a gaghị ahụkwa anya ọzọ n’ụwa a.   N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na nsonso a, ya bụ nwoke sị na ọ bụrụ na o nwere ka o si metụ ya n’ahụ na ọkụ ga-agbagbu nwa ya nwoke ahụ o hụrụ n’anya, na ya gaara eme ihe niile o nwere ike ime, iji hụ na ọ nọdụrụ ala n’ụlọ na gharakwa ịpụ̀ àpụ̀ ụbọchị ahụ ya bụ ihe mere.   Okwuodo, bụ onye kapịnta na nwunye ya na-azụ obere ahịa na be ha bụ Etekuru, ka a hụrụ na ha ka nọ n’oke mwute n’ihi ọdachi ahụ. Anyammiri juru ha anya n’ihi na o kweghị ha odidi.   Okwuodo, onye kabara ahụ gwa ndị ntaakụkọ okwu, kọwara otu nwa ya nwoke siri nwụ na ya bụ ọdachi,

N'Imo, ndị uweojii enyopuola ụlọụka ebe a na-atụba ụmụnwaanyị na-eto eto ime, ree ụmụ ha

NDỊ uweojii kọmandi nke steeti Imo awakpola otu ụlọụkaa nke dị na MCC, Uratta, n’okpuru ọchịchị Owerri North, na steeti ahụ ebe a na-atụba ụmụnwaanyi na-eto eto ime  ma na-edebe ha,ha amụọ nwa, e mechazie, e ree ụmụaka ndị ahụ.   Ozi si n’aka okwuputa okwu ndị uweojii steeti ahụ, Michael Abattam kọwara na ndị ọrụ uweojii bagidere nke ahụ oge e mere ka a mat ana otu onye aha ya bụ Amarachi Dioku gbara afọ iri na asatọ, onye Umudurualaoka, Uba Ifakala na Mbaitoli na-efu efu.   Ama gbara na a hụtara ya n’ụlọụka Jesus Life Assembly Church, Uratta.   Dịka ozi ahụ siri kwu, kọmishọna uweojii kọmandị steeti Imo, Rabiu Hussaini zipuru ngalaba ndị uweojii kọmandi ahụ na-ebuso ntọrị agha (anti kidnapping unit) ozigbo; bụ ndị mere ọsọsọ wee wakpo ụlọụka ahụ. Ya mere, a nwụchikọrọ onye mgbasa ozioma (evangelist) bi n’ụlọụka ahụ, Ugochi Orisakwe gbara afọ iri anọ na asaa, ma bụrụ onye e kwuru na ọ bụ ya bụ isi sekpụ nti n’òtù ịtụ mgbere ụmụaka nke a na-eme n’ogige ụlọụka ahụ, na ndị òtù ya ndị ọzọ.

N'Imo, nwoke e jidere ebe ọ na-akwasa nwa ya nwaanyị iko akwụọla ụdọ

EBELEBE gburu n’Amaigbo nke dị n’okpuru ọchịchị Nwangele na steeti Imo, n’ihi otu nwoke tụrụ ụdọ ka e jidechara ya ebe ọ na-akwasa nwa ya nwaanyị iko.   Otu onye ogbe ahụ gwara ndị ntaakụkọ na nwoke ahụ onye e kwughị aha ya eteela aka o ji akwanye nwa ya nwaanyị ka ha abụọ na-enwe mmekọ. Dịka o siri kwu, ndị obodo bidoro nyobe nwoke ahụ na nwa ya nwaanyị enyo nke mere ka ha jụọ nwoke ahụ ajụjụ banyere ọnọdụ ya na nwa ya mana ọ gọrọ agụgọ.   N’ihi ya, dịka azịza ya ejughị ha afọ, ụfọdụ ndị ụmụnna ya kpebiri ileru anya n’ebe nwoke ahụ na nwa ya nwaanyị nọ iji chọpụta nke bụ eziokwu. Otu ahụ ka ọnya ha siri mata anụ n’ihi na ha jidere ha ka ha na-akwa iko, agụgọ adịzịghị ya.   Ndị ntorobịa iwe na-ewe nọ nso jidere nwoke ahụ, onye chọrọ ka o si na windo mapụ. Ha mechara kpụga ya n’obi eze ọdịnala ha ebe e kwuru na ọ nọrọ jiri ọnụ ya kwuputa arụ o mere.   A manyere ya ka ọ kpụọ arụ n’ụzọ ọdịnala ma dịka o mechara nke ahụ ọ bara n’ime ọhịa dị nso, tụọ ụdọ.   E kwuru na ọ rịọrọ nwa ya nwaanyị

N'Imo, ndi omekoome awakpola ụlọọrụ uweojii na ụlọnga

Mebie ọtụtụ ihe, tọhapụ ndị nga IHE égwù mere na steeti Imo na nsonso, dịka ndị ojiegbe na ndị omekoome a maghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Owerri bụ isi obodo steeti ahụ, na ụlọ mkpọrọ dịkwa n’ebe ahụ, wee gbarikọọ ebe niile, ma kpọghepu imirikiti ndị nga nọgasị ebe ahụ ka ha laa na be ha.   Akụkọ kọrọ na ndị omekoome ahụ jí ọtụtụ ngwọgụ na ogbunigwè, bùrù ụzọ gụọ egwu, ma gbaa ọtụtụ egbe ruo ihe dịka awa atọ, tupu ha wakpo ebe ahụ, ma gbakwa ya ọkụ. Onye ọnọmgbeomere na-ekwukwa na ha bụ ndị omekoome jiri ogbunigwè wee gbagwòó ụlọọrụ ụfọdụ ndị na-arụ n’ụlọnga ahụ tupu ha wee meghepuzie ndị ahụ a tụrụ nga ebe ahụ.   N’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’isi ụlọọrụ uweojii ala Nigeria, bụ CP Frank Mba gbàrà akaebe na o nweghị onye uweojii ọbụla tụfuru ndụ ya n’ihi mwakpò ahụ, kama na ọ bụ naanị otu onye uweojii nwetara mmerụahụ n’ebe ahụ, n’ihi mgbọ tụrụ ya.   O kwuru na ọ bụ ndị òtù ‘Indigenous People of Biafra (IPOB)’ na òtù ọ