Ahịa na uru ọ bara n'ala Igbo
AHỊA bụ ụzọ ndị Igbo si azụ ma na-erekwa ihe. Ọ bụ otu ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe ezi mmekọrịta. A na-arụnyekarị ya n’etiti obodo. Ụbọchị ahịa ọbụla mmadụ niile na-esi n’ụlọ pụta gawa ahịa, ịga zụọ ma ree ihe. Ndị mmadụ na-esikwa obodo ha gaa ahịa obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu n’ihi na ọ bụghị sọ ndị obodo nwe ahịa na-azụ ya. Obodo na obodo na-azụkọrịta ahịa. Ọ bụ n’ahịa ka ndị Igbo na-ezikọrịta onwe ha ozi. N’ahịa ka ndị mmadụ chọrọ ịhụ onwe ha na-enwe ike ime ya. Ọ bụkwa n’ahịa ka a na-esi anụ ọtụtụ ihe mere n’obodo. Mgbe ọbụla mmadụ kọrọ ụkọ n’ahịa, a na-amalite jụba ese onye ahụ iji chọpụta ma o nwere nsogbu maka na ọ bụ n’ahịa ka a na-ahụ mmadụ, ụbọchị ahịa ọbụla. Ihe ọbụla mere n’ahịa bụ ihe mere n’anya ụwa niile n’ihi na ma mmụọ ma mmadụ na-azụ ahịa. Anaghị ezo ihe mere n’ahịa ezo. Nke a mere na mmadụ mee ihe ọjọọ dịka izu ohi n’ahịa, ọ na-abụ nnukwu ihe ihere n’ebe ya na ikwunaibe ya nọ. Ogbe ọbụla dị n’obodo nwe ahịa na-enwe ọdụ, ebe ha na-anọ ụbọchị ahịa ọbụla. Ony