Posts

Showing posts with the label Ime Ahịa

Ahịa na uru ọ bara n'ala Igbo

AHỊA bụ ụzọ ndị Igbo si azụ ma na-erekwa ihe. Ọ bụ otu ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe ezi mmekọrịta. A na-arụnyekarị ya n’etiti obodo. Ụbọchị ahịa ọbụla mmadụ niile na-esi n’ụlọ pụta gawa ahịa, ịga zụọ ma ree ihe. Ndị mmadụ na-esikwa obodo ha gaa ahịa obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu n’ihi na ọ bụghị sọ ndị obodo nwe ahịa na-azụ ya. Obodo na obodo na-azụkọrịta ahịa.   Ọ bụ n’ahịa ka ndị Igbo na-ezikọrịta onwe ha ozi. N’ahịa ka ndị mmadụ chọrọ ịhụ onwe ha na-enwe ike ime ya. Ọ bụkwa n’ahịa ka a na-esi anụ ọtụtụ ihe mere n’obodo.   Mgbe ọbụla mmadụ kọrọ ụkọ n’ahịa, a na-amalite jụba ese onye ahụ iji chọpụta ma o nwere nsogbu maka na ọ bụ n’ahịa ka a na-ahụ mmadụ, ụbọchị ahịa ọbụla. Ihe ọbụla mere n’ahịa bụ ihe mere n’anya ụwa niile n’ihi na ma mmụọ ma mmadụ na-azụ ahịa. Anaghị ezo ihe mere n’ahịa ezo. Nke a mere na mmadụ mee ihe ọjọọ dịka izu ohi n’ahịa, ọ na-abụ nnukwu ihe ihere n’ebe ya na ikwunaibe ya nọ.   Ogbe ọbụla dị n’obodo nwe ahịa na-enwe ọdụ, ebe ha na-anọ ụbọchị ahịa ọbụla. Ony

Ihe ahịa zụrụ ka a na-agba Isita

ỤBỌCHỊ ụka ka ndị otu Kraịst n’ụwa niile na-agba Isita. Ọ bụ oge e ji echeta mbilite n’ọnwụ Onyenwe anyị Jesu Kristi. Ọ bụ nnukwu emume kacha emume niile a na-eme n’ụka.   Dịka a na-eji abalị iri anọ mee emume icheta ahụhụ na ọnwụ Kraịst (lent), mgbe nke ahụ gachara, nke bụ oge ekpere na ebumọnụ, a na-abanye n’emume Isita nke bụ oge oriri na ọṅụṅụ.   Taa bụ Tọzdee dị asọ, ụbọchị e ji echeta oriri ikpeazụ Onyenweanyị na ụmụazụ ya riri. Echi bụ Ezi Fraịdee, nke bụ kpọmkwem ụbọchị e ji echeta ọnwụ ya n’obe. Ọ bụ ụbọchị ekpere na ebumọnụ n’ụzọ pụrụ iche. Ụbọchị Satọdee dị asọ, a ga-aka ụka abalị n’ụlọụka dị iche iche. Nke ahụ gachaa, abanya ụbọchị ụka bụ Isita.   Oriri ụbọchị ahụ bụ onye rikata, o rifọrọ ibe ya. Ụfọdụ na-egbu ehi, ewu, torotoro, ọkụkọ na anụ ndị ọzọ dịka aka ha onye. A na-azụkwara ụmụaka akwa ma akpụkpọụkwụ. Ndị okenye na-azụkwa nke ha. E wepukwa ihe ndị a, Isita na-abụ oge mmemme dị iche iche dịka, ịgba nkwụ, agbamakwụkwọ, ọṅụ nwa, ịkpọghe ụlọ, nzukọ wdg.   Ma ka ihe siri

Ihe ahịa zụrụ ka a na-akwado Ekeresimesi

NDỊ Igbo bụ agbụrụ na-azụ ahịa mana ọ na-adị egwu ma a banye n’ọnwa Ekeresimesi bụ Disemba. Ka ọ dị ugbu a, ọnwa agbaala ọkara ma gafee nke bụ na izuụka ọzọ ka a ga-agba Ekeresimesi. Ndị kwuru okwu sị na agha a kara aka anaghị eri nwa ngwọrọ; ya mere ọ sarala ọkụ. Ahịa niile na-ekwozi ka orimiri nke bụ na ọ bụrụ na ịmaghị ihe imere, ume ekoropu gị n’ọma ahịa. Ụfọdụ zụrụ ahịa na-egbego egbego, ụfọdụ azụrụ na-agbada agbada. Dịka anyị maara, ka mmadụ na-azụ ahịa ka mmụọ na-azụkwa. Ebe ụfọdụ bịara ịzụrụ ihe na-akpa ha ka ụfọdụ bịakwara izuru ihe na-akpa ha n’ohi. Ha na-eme nke a site n’iburu ngwa ahịa ma ọ bụ ibu (load) mmadụ gbalaga. Ụfọdụ ka a na-akpọ ndị ‘aka n’akpa’. Ndị a bụ ndị na-ewere ego mmadụ tinyere n’ime akpa ya larie. Iji gbanarị ọdachị ndị ohi, ụfọdụ ndị mmadụ na-anyanye akpa ha n’ọlụ, ebe ụfọdụ na-etinye ego n’ime ọbante ha. Ọ dị egwu, mana n’ime ihe niile ahịa na-azụ gwoo gwoo. N’akụkụ ndị na-ere ahịa, ụfọdụ na-akọwa na ahịa ha na-aga aga ebe ụfọdụ na-ebe akwa na njọ ahịa n

Ihe ahịa zụrụ dịka a na-abanye ọnwa Ekeresimesi

EMUME Ekeresimesi bụ emume a na-eme afọ ọbụla nke e ji echeta ọmụmụ onye nzọpụta. Ọ bụ ma ọnwa Disemba dị n’abalị iri abụọ na ise ka a na-eme ya. Ọ bụ emume na-ewe otu izuụka zuru ezu n’ihi ihe ndị ọzọ a na-agbakwunye na ya dịka nzukọ, ịgba nkwụ, ịgba akwụkwọ, idu obi/ụlọ, imepe ụlọ, w.d.g. Ọ bụ n’ihi nke a ka ọnwa Disemba ji bụrụ ọnwa mmemme tinyekwara ọnwa e ji eri ego. Maka nke a, ahịa na-ekwo ekwo ebe ndị mmadụ na-agbakeri ala azụkọ ihe ha ji agba ya bụ Ekeresimesi. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ejikwa ohere ahụ ala ụlọ. Ị gaa n’ahịa na nso nso a, ndị na-ere ere na-ebe ndị na-ego ego na-ebe. Isiokwu wee bụrụ na isi akwa adịghịkwa ebe a fanyere ya. Ndị mmadụ na-eti mkpu n’ihe siri ike nke ukwuu. Ọnụ ahịa rịrị arị karịa ka ọ dị na mbụ. Mana emere elu, emere ala, a ga na-azụ ahịa, ọkachasi oge ugbua n’ihi na e tere ụgba, e tere ogiri, a ga-agbarịrị Ekeresimesi. Nwokorobịa aha ya bụ Chidi, nọ n’ahịa Eke Awka ere akwa obube kwuru na ha anaghị ere ahịa otu o kwesịrị. Ọ kọwara na ihe kpatara nke a b