Korona: Gọọmenti Anambra ewepụtala usoro akwamozu ọhụrụ
IGBO sị na ọ na-abụ egwu dagharịa, a tụgharịa ọkpà egwu,maka na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke. N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ewepụtala usoro ọhụụ a ga na-agbasozị wee na-akwa ozu n’imesteeti ahụ, iji belata mgbasa ọrịa nje korona na ya bụ steeti. Nke a bụ nke e mereka ụwa mara site n’ozi a kụpụrụ n’isi mbido izuụka a banyere usoro ọhụụ ahụ, bụnke ọ bụ ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu binyereaka na ya. ỌkammụtaChukwulobelu sikwara n’ozi ahụ chètara ọhaneze steeti ahụ na Gọvanọ WillieObianọ ebinyela aka n’akwụwkọ iwu korona, bụ nke kpọpụtasịrị ntụziaka dị icheiche a ga na-agbasozị na steeti ahụ ugbua maka ọrịa ahụ, ya na ntaramahụhụ dịịrịonye ọbụla nupùrù isi na nke ọbụla n’ime ya. Dịka o siri dịn’usoro ọhụụ ahụ e wepụtara a ga-esi na-akwazị ozu, onye ọbụla mmadụ nwụnahịrịga-eli ya ozigbo, ma bụrụkwa nke a ga-eme n’ịgbaso ntụziaka ahụ gọọmenti nyeremaka ibelata mgbasa ọrịa korona. Ozi ahụ a kụpụrụ kọwarana a gaghị na-akarịzịkwa mma