Ezinaụlọ edegarala ndị isi uweojii akwụkwọ mkpesa maka ọnwụ nwa ha
EZINAỤLỌ Ikechukwu Ani lara mụọ, bụ onye na-azụ ahịa n’Enugu edegarala ndị isi uweojii akwụkwọ mkpesa maka ihe ha kpọrọ igbu mmadụ n’ụzọ ezighi ezi ‘extra-judicial killing’. Akwụkwọ mkpesa ahụ gwara ndị isi uweojii ka ha lebaa kọmanda nke ‘Anti-cult Police Unit’ Enugu, anya gbasara imesi mmadụ ike iji chọpụta nke bụ eziokwu (torture) na iri ngarị. Ha kwuru na Ikechukwu Ani nwụrụ n’ihi mmesi ike nke ndị ọlụ ‘Anti-cultism Unit’ Enugu, mere ya. Nwunye Ikechukwu Anị lara mmụọ bụ Promise Ani kọwara na ndị otu ndị uweojii ahụ wụchara n’ebe obibi ha n’ihe dịka elekere abụọ nke ụtụtụ ka ọnwa Jenụarị dị n’abalị isii wee nwụchịkọọ di ya bụ onye gbara afọ iri abụọ na asatọ n’ihi ebubo na o kwere nkwa igbu ndị uweojii na-enye ọhanaeze nsogbu. Ọ kọwara na di ya kwuru na ya ekwughị ụdị okwu ahụ. Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii ekwesighị imesi ya ike abalị anọ n’enyeghị ya nri ma gakwaa n’ihu were nsị gbuo ya. O kwuru si; “oge ha hapụrụ ya, di m gwara m na ndị uweojii ahụ jiri hama kụbaa ntu abụọ n’