Posts

Showing posts with the label Ijummiri

Ijummiri achụpụla onyeisi obodo na ụfọdụ ndị obodo ya n'ụlọ

ỤFỌDỤ ndị obodo Ikot Obio Atai dị n’okpuruọchịchị Itu nke steeti Akwa Ibom ahapụla ụlọ ha ma rie mbọmbọ ọsọ maka ndụ ha, ka ijummiri wakpòrò ụlọ ha dị icheiche ma tochie ebe niile.   Ọtụtụ ndị obodo ahụ, ndị enweghị ego ịkwagharị n’ụlọ ọzọ, bụkwàzị ndị a hụrụ ka ha na-eji ihe ekupusi mmiri n’ụlọ ha oge ọbụla, ọkachasị oge mmiri zoro.   Akụkọ kọrọ na ya bụ ijummiri achụpụla onyeisi obodo Obong Mkpong n’ụlọ ya, ya na ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ ruru narị ise n’ọnụọgụgụ n’ihi na mmiri etokpòla ụlọ karịrị otu narị na iri abụọ n’ọnụọgụgụ na mpaghara ebe ahụ.  Otu onye bi na mpaghara ma bụrụkwa otu onye n’ime ndị ijummiri ahụ wakpòrò ụlọ ha, bụ Maazị Ekpe Sunday, kwuru na mmiri na-etoju n’ime ụlọ ya oge ọbụla mmiri zoro. O kwukwara na ọ kà bi n’ebe ahụ n’ihi na o nweghị ego iji rụọ maọbụ kwaje n’ụlọ ọzọ, nke mezịrị o ji ka biri n’ebe ahụ ma jiri ihe na-ekusi mmiri n’ime ụlọ ya oge ọbụla mmiri na-ezo.   N’okwu nke ya, otu onye ọzọ ajọ ọnọdụ ahụ metụtara, ma bụrụkwa onye na-ere garrị, bụ Mercy kwar

Ijummiri e gbuola mmadụ karịrị narị atọ na China

Image
KA Ọ gachaara ihe dịka izuụka olenaole ijummiri kpachara mkpamkpa dị égwù na mba China, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n’ihi ijummiri ahụ eruola mmadụ narị atọ na abụọ (302).   Ọ bụ onye Mayor nke mpaghara Zhengzhou, bụ Hou Hong kwupụtara nke a na nsonso a, bụkwa nke o sitere na ya wee mee ka a mara na mmadụ iri atọ na iteghete n’ime ndị ahụ bụ ndị a hụrụ ozu ha n’ime ụlọ dị n’okpuru ala ebe a na-adọba ụgbọala.   Ijummiri ahụ bụ nke gbara oge nnukwu mmiriozuzo zochara na mpaghara Henan etiti mba China, bụkwa nke metụtara mpaghara ebe dị iche iche, bibie ọtụtụ ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ, bucharasịkwa ụgbọala na-agbara onwe ha n’ụzọ, ma takwa isi ọtụtụ ndị mmadụ.   Akụkọ kọrọ na ya bụ mmiriozuzo na ijummiri ọ gbara mètụtàrà mmadụ ruru nde iri na atọ ma bibìkwa ụlọ ruru puku iteghete n’ọnụọgụgụ, ebe ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efukwa efu ruo taa. Ụfọdụ ebe ijummiri ahụ kpara mkpamkpa na ndị na-azọ isi onwe ha Ụfọdụ ebe ijummiri ahụ kpara mkpamkpa na ndị na-azọ isi onwe ha Ụfọdụ ebe ijummiri ahụ kpara mkpamk