Posts

Showing posts with the label Iju mmiri

Gọọmenti Anambra ekesaarala ndị iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n'ụlọ ihe nkwàdó

 DỊKA otu n’ime ụzọ isi belatara ha ihe isi ike, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekesaarala ndị ahụ nsogbu iju mmiri metụtara ihe oriri nà ihe nkwàdó dị icheiche na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Awka North nke steeti Anambra.   Ebe dị icheiche e kesàrà ihe nkwàdó ahụ gụnyèrè ogige ụlọ ikwuu nke ‘Agueke Primary School, Ugbenu’ (nke nwere mmadụ karịrị otu narị na iri ise ndị iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n’ụlọ ha), ogige ‘Central School Ugbene’ (nke nwere mmadụ karịrị narị abụọ na iri ise ndị iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n’ụlọ ha), na ogige ‘Central School Awba-Ofemili’ (nke nwere mmadụ karịrị narị ise ndị iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n’ụlọ ha).   Ya bụ ihe nkwàdó bụkwà nke e bugaara site n’aka Onyeisioche Nchereoge n’okpuruọchịchị Awka North, bụ Maazị Emmanuel Ucheze, ma bụrụkwa nke gụnyere  ehi isii, ọtụtụ akpa osikapa, ọtụtụ akpa àgwà, ọtụtụ akpa garrị, ọtụtụ mba ji ụdị mmanụ dị icheiche e ji esi nri, yabaasị̀ nà ihe ndị ọzọ dị icheiche e ji esi nri.   Ụfọdụ ebe ndị ahụ e zigara ihe ahụ b

Iju mmiri agbàgbuola mmadụ isii na Nzam

Image
ANYAMMIRi zòrò ka mmiri na nsonso a n’obodo Nzam dị n’okpuruọchịchị ime obodo Anambra West nke steeti Anambra, dịka iju mmiri gbàgbùrù mmadụ isii bụ ndị otu ezinụlọ n’ime ụlọ ha.    Nke a bụ nke dapụtara ka ọ gachara ihe dị ka abalị olenole ọtụtụ mmadụ jiri nwụọ oge ụgbọ mmiri kpùrù n’okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru dịkwa na steeti ahụ, oge o bu ụfọdụ ndị mmadụ iju mmiri ahụ tokpòrò wee na-aga ebe ọzọ.   Dịka ihe vidio na-efegharị ugbua n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ siri kwuo, iju mmiri ahụ gbàgbùrù ndị ahụ n’ime ụlọ ha ka ha mèchàrà nkwadobe maka ikwapụ̀ n’ụlọ ahụ, tupu iju mmiri ahụ wee too, zachakọrọ ha ma gbagbuo ha. Otu onye ọnọmgbeomere kọwàrà na mmadụ isii ahụ gụnyèrè otu nwaanyị, ụmụ ya anọ na otu nwanne ya nwanyị.    Vidio ahụ gòsìkwàrà ka ndị ntorobịa ahụ na-ebupụ̀tasịkwa ozu ndị ahụ n’ụlọ ha ebe iju mmiri gbàgbùsiri ha, ebe ọtụtụ ndị mmadụ nọkwa ebe ahụ na-ebe akwa maka ajọ ọdachi ahụ nà mkpamkpa ndị ọzọ iju mmiri ahụ na-akpa n’obodo ahụ na ụfọdụ ebe ndị ọzọ n’ime steeti a

Ndị Ayamelum akwaala arịrị banyere mkpamkpa iju mmiri

ONYE ọ na-eme omume-omume na-ebe obube-obube, maka na ọ na-abụ nnụnụ mechie ọnụ ya agụụ egbughị ya, akpala afụchie ya ikè.   Ụmụafọ obodo dị icheiche dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum akwaala arịrị banyere mkpamkpa dị icheiche iju mmiri na-akpa na mpaghara ahụ, nà ụzọ dị icheiche nke ahụ si emetụta ha.   Ọ dị ncheta na nnukwu iju mmiri wara na mpaghara ebe dị icheiche na steeti Anambra na nsonso a, nke obodo dịgasị n’okpuruọchịchị Ayamelum, Ogbaru, Anambra West so na ya. Ya bụ iju mmiri bụkwa nke tokpòrò ụlọ obibi, ụlọakwụkwọ, ugbo ebe a kọrọ ihe, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ na mpaghara ahụ.   N’ihi ajọ ọnọdụ, mmetụta ọjọọ na ihe ụfụ dị icheiche ọ na-ewetara ha, ụmụafọ obodo dịgasị n’Ayamelum akpọkuola gọọmenti steeti ahụ, gọọmenti etiti, nà òtù mba ụwa dị icheiche ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.   N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, onyeisi ọchịchị obodo Anaku dị n’Ayamelum, bụ Maazị Paul Nwuba kọwàrà na ya bụ iju mmiri bụ nke na-awa kwà afọ ọbụla, ma kpọọ òkù ka a chọọ ihe a ga-eme banyere ya b

Gọọmenti ekwela nkwà mgbataọsọ dịka iju mmiri wakpòrò ụfọdụ obodo n'Anambra

Image
ỌSỌ agbaala n’ụfọdụ obodo dị icheiche ugbua n’ime steeti Anambra dịka iju mmiri wara ma tokpò ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ, ụlọakwụkwọ, ugbo ebe a kọrọ ihe, na ebe ndị ọzọ.   Ya bụ ihe ọdachi iju mmiri ná-áwákárị́ kwà afọ ọbụla, bụ nke wara n’obodo dị icheiche dịgasị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru, ma bụrụkwa nke chụpụ̀gòrò ọtụtụ mmadụ n’ụlọ ha ugbua ma bibisiekwa ihe ha kọrọ n’ugbo.   Ụfọdụ n’ime obodo ebe ya bụ iju mmiri kachara metụta gụnyèrè Ogwuikpele, Akiri-Ogidi, Atani, Osamala, Umu-Uzu, Odeh, Igbede, Odekpe, Odomagwu, Igbokenyi, na ụfọdụ ebe ndị ọzọ.   N’okwu ya oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụọnụ, onyeisi ọchịchị obodo Ogwuikpele, Maazị Madupuo Sunday Victor kwàrà arịrị banyere ihe dị icheiche ha na-agabiga n’ihi ajọ ọnọdụ ahụ, ma kpọọ òkù ka a chọpụta usoro ọkpụtọrọkpụ kacha mma a ga-esi gbochie ya bụ nsogbu ka ọ ghara ịdapụtazị ọzọ.   Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị obodo Akiri-Ogidi, bụ Maazị Micheal Chukwuse mèkwàrà ka a mara na ajọ ọdachi ahụ metụtara ha n’ọtụtụ ụzọ

Iju mmiri etoola n'ụlọọgwụ, gbuo ndị ọrịa iri na asaa

O PEKATA mpe,  ndị ọra iri na asaa anwụọla ka iju mmiri tojuru ụlọọgwụ n’ihi oke mmiri ozizo na Central Hidalgo Mexico.   E kwuru n’ihi oke mmiri, otu oshimiri tojuru ma toffee dịka o kwesịrị nke mere ka o nupu n’ike wee kwobaa obodo.   E kwuru na ọtụtụ ndị ahụ lara mmụọ bụ ndị na-arịa korona ma bụrụ ndị e ji akpati okuku ume ‘oxygen’ enye ọgwụgwọ.   Ndị nọ na-azọ ndụ (rescuers) ka e kwuru na ha zọpụtara ndị ọrịa iri anọ. Otu o sila dị, a kọwara na ugbọ mmiri bu gọvano steeti ahụ milara n’ime oshimiri ahụ. Ma otu o sila dị, e mechakwara zie ozi na gọvanọ ahụ nọ n’udo ebe ọ nọ ugbu a, dịka e kwuru na ndị ọchịchị steeti ahụ ga-aga n’ihu n’ịchịkọba ọrụ ntụmadị n’ebe ndi o metụtara nọ.

Iju mmiri, ide akpaala mkpamkpa n'Ughelli

IJU mmiri etojuputela mpaghara dị iche iche n’Ughelli na steeti Delta. Puku kwuru puku ndị mmadụ esila n’ụlọ ha kwapụ ebe ngwongwo gburu nde kwuru nde ego lara n’iyi n’ihi ajọ ọnọdụ nke iju mmiri debere obodo ahụ.   Oge ndị ntaakụkọ kpọtụụrụ ebe ahụ, a hụrụ ndị bi n’ogbe ahụ ka ha na-agbapụ n’ike n’ike ka mmiri ghara iburu ha. Ọtụtụ enweghị ike ịnyapụ ụgbọala ha dịka iju mmiri topuru ma jụ ikwe ka ụgbọala gaa. Ọtụtụ ndị o metụtara kwara arịrị ma kwuo na ha tetara ụra hụ ka mmiri tojuputara ụlọ ha ma laa ngwongwo ha n’iyi n’ihi oke mmiri ozizo, nke zoro abalị atọ n’ebe ahụ.   Otu nwoke bi n’ụlọ dị n’okporoụzọ Omoyibo aha ya bụ Chief Godwin Ighoavwota kwara arịrị banyere ọnọdụ iju mmiri ahụ, ma rụtụ aka na nke ahụ etinyela ọtụtụ ndị mmadụ n’enweghị ụlọ dịka mmiri chụpụrụ ha na be ha ma laa ngwongwo ha n’iyi.   Ighoavwota kọwara na ọwa mmiri, tinyere nti mmiri niile sụchichara asụchị ma kpọkuo Gọọmenti Etiti na steeti, na ndị òtù (agencies) gọọmenti ka ha gbatara ha  ọsọ enyemaka site n’ị

Obianọ agaala njem nleta n'ebe ahụ iju mmiri na-enye nsogbu

Image
AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụnyaahụ wee gaa njem nleta n’ụfọdụ mpaghara ebe ahụ iju mmiri wara, na-enyekwa nsogbu n’okpuru ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ. Mpaghara ebe ndị ahụ gọvanọ gara njem nleta ahụ gụnyèrè okpuru ọchịchị ‘Anambra East’, ‘Anambra West’ na Ogbaru, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche n’ime steeti ahụ sonyere na ya, ma onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)’, bụ Maazị Paul Odenigbo, ndị ọrụ nchekwa na ụfọdụ ndị ọzọ dị iche iche. N’okwu ya na njem ahụ, nke ha banyere ụgbọ mmiri wee gaa, Gọvanọ Obianọ mère ka a mara na ya bụ mmiri agbadàála ihe dị ka otu fuutù ma ọ bụrụ na a tụlee etu ọ dị n’ime ọnwa gara aga. O gosipụtakwara olileanya o nwere na ihe ndị ahụ ga-emechaa gabìga n’enweghị ihe ọdachi ọbụla siri na ya pụta. Obianọ (n’etiti) na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na njem nleta ahụ. O kwere nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’ịkwàdò na ilekọta ndị ahụ ya bụ iju mmiri tokpòrò, ọbụna

Oke iju ọgbụgba: Anambra ebekuola gọọmentị etiti

NDỊ mmadụ bi n’ihe karịrị obodo iri anọ n’okpuru ọchịchịAnambra West, Ayamelum, Ogbaru na Awka North n’ime steeti Anambra na-akwa akwaarịrị banyere oke iju mmiri na-echere ha aka mgba ma n’ụlọ ma n’ugbo ha.   Ka ọ dị ugbu a, ụmụnwaanyịabụọ dị ime na ụmụnwoke anọ ka e kwuru na ha anwụọla, ebe ugbo, ụlọ na ngwongwogburu nde kwuru nde naịra alaala n’iyi tinyere na enweghịzị ihe ndị mmadụna-emezi iji nyere onwe ha aka na mpaghara ahụ niile n’ihi ọnọdụ ọjọọ iju mmiridebere ha.   Ndị bi na mpagharaahụ, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ọrụugbo abụrụla ndị enweghịkwa ihe ha na-eme dịkammiri tokporo ugbo ha niile ma chụpụkwa ha n’ụlọ.   Onye omebe iwu na-anọchiteanya Anambra West n’ụlọnzukọ omebe iwu bụ Patrick Obalim-Udoba gwara ndị ntaakụkọna iju mmiri etochiela n’obodo niile dị n’ọgbọ nta vootu ya.   Obalim-Udoba kwuru sị:“Iju mmiri tochiri ma mebichaa ihe n’ọtụtụ ebe n’Anambra West. Ọ chụpụla ọtụtụn’ime ha n’ụlọ, otu ahụ ka ọ dị n’Anambra East, Ogbaru, Ayamelum na Awka North.Iju mmiri ahụ dị egwu.

Iju mmiri: Agwọ na-arịbatazị n'ụlọ ndị mmadụ n'Ogbaru

ỤMỤANỤMANỤ ọjọọ na-arị arị (reptiles) dịka agwọ na-arịbachazịn’ụfọdụ ụlọ ndị mmadụ n’okpuru ọchịchị Ogbaru na steeti Anambra n’ihi iju mmirina-eto ebe ahụ.   Maazị Arinze Awogu,onyeisioche (Transition Chairman) nke kansụl Ogbaru onye kwuputara nke a kọwarana ụfọdụ ndị ọ chụpụrụ n’ụlọ na-agazi na kampụ ebe gọọmenti Anambra kwadooroha.   Awogu kwuru naosimiri Niger na-eto n’ike n’ike mere na iro, tinyere ọwa mmiri na-abanyen’osimiri ahụ na-alaghachịzi azụ. O kwuru na o pekata mpe ndị mmadụ dị otu pukun’ọnụọgụ akwapụla n’ụlọ ha.   Ogbaru na obodo irina isii mejuputara ya bi n’akụkụ osimiri Niger. O kwuru na nnukwu agwọ (cobra)rịbara n’ụlọ mmadụ n’Atani bụ nke e gburu site n’enyemaka ndịuweojii AtaniDivisional Police Station.   Dịka o siri kwu, egburu agwọ ahụ n’Atani, na nwoke e gburu ya gbanahụrụ agwọ ahụ ịta ya n’abalịahụ dịka ọ nọ n’obere ụlọ (boys quarters) na-achọ ihe dị ya mkpa.   O kwuru sị; “Dịka ọhụrụ agwọ ahụ, ọ kpọchịrị ụzọ ozigbo ma kpọọ ndịuweojii divishọn Atani bụ ndị bịaraw

N'Akwa Ibom, iju mmiri achụpụla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ

OKE mmiri ozizo nke kpatara iju mmiri (flood), emebiela ụlọ ọnụọgụya ruru otu narị, ma chụpụ ihe ruru narị mmadụ atọ n’ụlọ n’okpuru ọchịchị Eketdị na steeti Akwa Ibom.   Maazị Ubong Markonye bi n’Edem Udom dị n’Eket, oge ọ na-ekwuputa ka o siri me kwuru na yaataala ahụhụ site n’iju mmiri n’ebe ahụ kemgbe afọ asatọ.   O kwuru sị; “Ijummiri nke taa dị egwu n’ebe m nọ. Anọ m n’ụlọ na-akwado ịga ụka oge mmiribidoro batawa n’ụlọ m. Dịka m na-agwa ụnụ ugbu a, atụfuola ọtụtụ ihe m ji birin’ụlọ dịka akwụkwọ, eletrọniki, akwa, laptọọpụ na ọtụtụ ngwongwo m ndị ọzọ.”   Mark gara n’ihu kwuona ya bụ ọdachị etinyela ọtụtụ ndị bi ebe ahụ, tinyere ndị nwe ụlọ ahịa (shops)na nsogbu. O kwuru na ngwongwo gburu nde kwuru nde naịra alaala n’iyi n’ihi ijummiri na-eto n’Eket.   Otu o sila dị, ọ kpọkurugọọmenti ha ka ọ gbata ọsọ enyemaka.

SEMA adụọla ndị bi n'akụkụ mmiri ka ha dị njikere ịgba ọsọ iju mmiri

N’IHI na ọ na-adị mma ịma ọkwà mmiri tupu ụbọchị ozùzo ya, a kpọkuola ma dụọ ndị bi na mpaghara ogbu mmiri ka ha mụrụ anya ka azụ ma dịkwa njikere maka ịkwagharị ọnọdụ oge adịghị anya, n’ihi ọkwà ahụ a na-ama bànyere iju mmriri nke a na-atụ anya na ọ ga-agba gwòògwò n’ahọ a. Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ onyeisi òtù ahụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụ-gbanụ na steeti Anambra, — bụ ‘State Emergency Management Agency’ — Maazị Paul Odenigbo na nzukọ inye nkuzi na ịdọ aka na ntị e mere n’okpuru ọchịchị Ayamelụm na Awka North n’otù n’ótù, ma gwa ndị ahụ na ha ga-ama na ya bụ iju mmiri awụchiela ngwangwa ha hụrụ na ogoogo mmiri dị n’obodo ha etobela. Maazị Obidigbo, nke onye nọchitere anya ya bụ onye enyemaka nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ụlọ ọrụ SEMA na mgbasa ozi, bụ Maazị Emeka Obinwa chètààrà ndị ahụ na ya bụ ozi abụghị iji wee mapụ ha obi ma ọ bụ mee ka egwù bàá ha ahụ, kama na ebumnobi ya bụ iji wee gbochie ya bụ ajọ ọnọdụ ịdabido ha n’amaghị ama, ma ọ bụ n’akwadoghị akwado. Ọ kpọp

Iju Mmiri: Mmadụ iri na asaa amụọla ụmụ n'ebe e weputaara ndị mmiri chụpụrụ be ha

KỌMISHỌNA na-ahụ maka ahụ ike na steeti Anambra, Dọkịta Josephat Akabuike, emeela ka a mara na ihe ruru ụmụnwaanyị iri na asaa amụọla ụmụ n’ebe dị iche iche e wepụtara maka ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha. Kọmishọna Akabụike kwuru nke a oge ọ na-anabata ndị otu ‘Nigerian Medical Association’ (NMA), ngalaba nke steeti Anambra, bụ ndị bagidere n’ọlụ ahụike nso nso a n’ogige ebe ahụ e wepụtara maka ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha na Agụleri dị n’okpuru ọchịchị Anambra East na Atanị dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru. O kwuru na n’ime ụmụnwaanyị ndị nọ n’ogige ahụ nke dị n’Atanị, na abụọ n’ime ha amụọla ụmụ, n’ụlọ ahụike ‘Comprehensive Health Centre’ (CHC) dị n’obodo ahụ, ma kwuo na ọchịchị steeti ahụ etinyesiela atụmatụ dị iche iche ga-enye aka ịhụ na ụmụnwaanyị dị ime nọ n’ogige niile e nwere na steeti ahụ maka ndị iju mmiri chụpụrụ na be ha ga-enwe ezi nchekwaba ma nọrọkwa n’ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà. N’okwu nke ya, onye ji ọkwa ‘State Hospital Director’, na steeti ahụ bụ Dọkịta Richmond A

Iju mmiri àgbàgbuola onye ọzọ, tokpò ụlọikwuu n'Igbariam

DỊKA akụkọ banyere mkpá mkpá iju mmiri na-àkpá na-agbasawanye, akụkọ ndị ọhụrụ gara n’ihu na-apụtawanye, dịka ya bụ iju mmiri gbàgburu otu onye ọzọ n’Ịgbarịam dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’, ma tokpòkwa Ụlọikwuu Izuzu (Izuzu Camp). Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ ndị obodo ahụ, dịka ha kpọgharịrị ndị nta akụkọ n’ebe ahụ iji gosi ha mkpa mkpa iju mmiri ahụ kpàgoro na ya bụ obodo. Iju mmiri ahụ bụ nke e mere ka a mara na o mebiela ọtụtụ ihe dị iche iche ma bibiekwa akụnụba gburu ego ruru nde kwùrú nde Naịra. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ dịka ọ na-akpọgharị ha ebe ahụ, onyeisi oche nke ụlọikwuu ahụ, bụ Maazị Anthony Okafor, kwàrà arịrị banyere ya bụ ajọ ọnọdụ, ma meekwa ka a mara na ya bụ iju mmiri wakporo ma tochiekwa mpaghara ebe ahụ niile kemgbe ihe dịka otu ọnwa, we mezie ka ha bụrụ ndị bu ọnụ nri na ndị enweghị ebe obibi. Ọ kpọkuzịkwara gọọmenti n’ogoogo dị iche iche ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka iji zọọ ha ndụ n’ihi na ya bụ ajọ ọnọdụ iju mmiri na-abawanyezịkwa ụba n’og