Posts

Showing posts with the label Ihe Isiike

Echiche ndị mmadụ banyere ọnọdụ ihe isiike cheere ụwa aka mgba n'oge a

DỊKA ihe siri ike n’oge ugbu a nke mere na onwekebeghị ihe na-aga otu o kwesịrị, ndị mmadụ na-enye mkpesa na isi akwa adịkwaghị ebe a fanyere ya. Onye elu na-ebe, onye ala na-ebe, o nwekwaghị onye ọ dịịrị mma.Ha kwuru sị: Maazị Obi Kenneth – Nwanne m efe nyeghị maka na a hụghị akpa akpanye ọkazị. Ihe siri ike n’ihi na agụụ na-achọ ịnara m ụmụ m. Anaghị m ekwu okwu igo ụgbọala maọbụ ọgbatumtum kama ọ bụ nri, ihe a na-eri eri ka m na-ekwu maka ya. Ọnọdụ ụwa dị ugbu a mere na anaghị m akpatazi ihe m ji enye ezinaụlọ m nri. I gote ahịa kpọsa, ọ dịghị onye na-ego, ụfọdụ na-ego n’aka, ha mechaa ha ejide gị ụgwọ, ha agaghị akwụ ya. Ọtụtụ ndị mamdụ na-eme ha goro gị ahịa ha agaghị esikwa n’ihu ọdụ ahịa gị gafee ụbọchị ọzọ.   Otu nwaanyị bịara goro m ihe n’aka yaabụ, ọkara akpa agwa, kemgbe ọnwa ise ruo taa ahụbeghị m ya anya. Ị kpọọ ya n’ekwentị ọ sị gị biko nweere ya ndidi na o nwere ka ihe siri dịrị ya ugbu a. Ọ na-agwa m na o nwere ka ihe siri dịrị ya, ọ ma ka o siri dịrị m. Jụọ m ma ọ bụ i