Posts

Showing posts with the label Igwe Mike Idigo

COVID-19: Igwe Agụleri enyela gọọmenti Anambra otu nde naịra

KA Ọ DỊ TAA, eze ọdịnala obodo Agụleri dị n’okpuru ọchịchịime obodo Anambra East, bụ Igwe Mike Idigo enyela gọọmenti steeti Anambra ego dịotu nde naịra, iji kwàdo ya n’ibuso ọrịa nje korona agha n’ime steeti ahụ.   Igwe Idigo, onye ọ bụya na ndị ichie ya soro wee bịa n’obi gọọmenti dị n’Awka inyefe ego ahụ n’akaòtù ọrụ ahụ gọọmenti guzobere maka ya bụ ọrịa, mèrè ka a mara na ọ bụ ya na ndịichie ya tụkọrọ arò ọnụ, wee hụ na ọ bụ ihe kwesiri omume, bụ ịkwàdo gọọmentina ya bụ agha ọ na-ebu megide ọrịa ahụ, kemgbe ọnwa gara aga.   O kwupụtakwara eziolileanya o nwere na steeti ahụ ga-enweta mmeri na ya bụ agha, ọbụnadị dịka ọ dụrụNdị Anambra ọdụ ka ha dọnyere gọọmenti ukwù n’ime nke ahụ, site n’ịkwàdo ya nairube isi nye ntụziaka dị iche iche o nyere bànyere ọrịa ahụ.   Onye nabatara ya bụego n’aha ọchịchị steeti ahụ ma bụrụkwa ode akwụkwọ ukwu steeti Anambra, bụ ỌkammụtaSolo Chukwulobelụ kèlere Igwe Idigo na ndị ichie ya maka nzọpụ ụkwụ ahụ.   Ọ kọwara na obi dị gọọmentisteeti ahụ ụtọ banye