Obianọ enyela ndị eze ọhụrụ abụọ akwụkwọ ikike
Ọ NA-ADỊ mma a kpụọ djii, a kpụnye ya óké ji n’aka, maka naa nyụchaa nsị a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò. Oke ọñụ dàrà nansonso a dịka aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyèrè eze ọdịnalaọhụụ abụọ asambodo, iji malite ọrụ n’ozuzu òkè dịka ndị ndu obodo ha dị icheiche. Ndị eze ọdịnala ọhụụ abụọ ahụ e nyere asambodo bụ Igwe Lawrence Nwafia,onye e nyere asambodo ịbụ eze ọdịnala Ezi-Agulu-Otu Aguleri, na Igwe JohnsonMbanefo, onye e nyere asambodo ịbụ eze ọdịnala Mkpunando Aguleri. Iguzobe ndị a dịkandị eze ọdịnala ọhụụ obodo ha dị iche iche, bụ nke bịara dịka ndị obodo ahụ chụtùchàràeze ọdịnala ha ndị nọbụ anọ n’ọkwa ahụ, mgbe gọọmenti steeti Anambra nyèchàràha na ụfọdụ eze ọdịnala ndị ọzọ oche azụ, site n’ịsị ha sepùgodi aka n’ọrụ,n’ihi ihe ezighị ezi ha mere. N’okwu ya oge ọna-enyefe ha àsàmbodo ahụ na mmemme ahụ weere ọnọdụ n’Amawbịa, Gọvanọ Obianọ kọwàràomenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịbendị dịka ihe dị ezi mkpa na nke bakwara urùnke ukwuu, ma kwupụta mkpa ọ dị