N'Anambra, ndị omekoome akpaala mkpamkpa n’obi Igwe Ifitedunu
OPEKATAMPE, mmadụ atọ (gụnyere ụmụaka abụọ na otu agadi nwaanyị) gbanahịrị ọnwụ ike káárá ịdakwasị ha na nsonso a, dịka ndị omekoome a maghị ndị ha bụ wakpòrò be eze ọdịnala obodo Ifitedunu dị n’okpuru ọchịchị obodo Dunukọfịa nke steeti Anambra. Mwakpò ahụ bụ nke ndị omekoome ahụ mere ụbọchị Mọnde, ma bụrụkwa nke ha nọrọ na ya wee bibie ọtụtụ ihe n’obi eze ọdịnala ahụ, ma gbakwa ọtụtụ ihe ọkụ tupu ha rie mbọmbọ. N’okwu ya oge ọ na-akọwara ndị ntaakụkọ banyere mwakpò ahụ, Igwe Chukwuemeka Ilunọ kwupụtara obi mwute ya banyere mwakpo ahụ na ajọ ọdachi ahụ. Ọ kọwara ihe ahụ dịka ihe arụ, bụ mwakpo ahụ a wakporo ya bụ obi eze, ma mee ka a mara na ndị omekoome ahụ sitere na mwakpo ahụ wee bibie ọtụtụ ihe ọkpụ, ihe ochie, na akwụkwọ dị iche iche iche dị mkpa banyere ọchịchị obodo, wee suo ha niile ọkụ, ha gbaa pịàtàà. Dịka ọ na-ekwupụta na ọ bụ ezi e na o nweghị ndị a na-enyo ènyo na ọ bụ ha mere ihe ahụ, Igwe Ilunọ gbara akaebe na e nwere nsogbu ọchịchị obodo n’Ifitedunu, bụ nọgoro ọtụ