N'Umuoji, Igwe Enweze agbaala ọfala ikpeazụ
Ọ ZỤRỤ ka ahịa n’Ụmụoji dị n’okpuru ọchịchị ‘Idemili North’ nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ gbaara eze ọdịnala ha nwụrụ anwụ, bụ Dọkịta Cyril Nwabunwanne Enweze Ọfala ikpeazụ. Mmemme ịgba Ọfala ikpeazụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, bụ sitere ebe dị iche iche wee bịa iso kwanyere eze ọdịnala ahụ ugwu ikpeazụ. Igwe Enweze, onye chịrị Ụmụoji ahp iri na anọ, nwụrụ ka ọ gbachara ahọ iri asaa, ma bụrụkwa onye rụrụ ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ ‘Anambra State Investment, Promotion, and Protection Agency (ANSIPPA)’. N’okwu ya na mmemme Ọfala ikpeazụ ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba kọwara Igwe Enweze dịka ezigbo mmadụ jiri amamihe ya na obi ya niile wee jeere steeti ahụ na obodo ya ozi, ma mekwa ka a mara na ya bụ eze ọdịnala dọtààrà steeti ahụ ego ihe mwunye karịrị ijeri dọlà anọ mgbe ọ bụ onyeisi ụlọ