Posts

Showing posts with the label Igbo Newpaoer

Ighafu ọbara: Gọọmentị Nigeria bu iru abụ – Ndị bishọọpụ

Chinwendu Uzoatu   NDỊ ‘Catholic Bishops Conference of Nigeria’ (CBCN) amala Gọọmentị Etiti ikpe gbasara ọnọdụ nsogbu nke ndị ọlụ ugbo na ndị na-achị ehi nke ekweghịkwa mmadụ ñụrụ mmiri togbọ iko ma bụrụkwa nke kpatagoro ọnwụ nari kwuru nari ndị mmadụ na steeti Taraba, Plateau, Nasarawa na Benue. Ndị bishọpụ a kwenyere na gọọmentị a haziena usoro iwu Nigeria ka ọ chekwaa ndị na-achị ehi ma tinyezie ndị ọlụ ugbo na mwakpo ebeebe. Ha na-atụ uche na udo na ịdị n’otu nke ala Nigeria ga-ama afọ n’ala ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ngwa ngwa wepụ aka ngwere n’ofe ma kpee ikpe mkwumọtọ n’ebe onye Nigeria ọbụna nọ n’agbanyeghị agbụrụ na ụka onye na-aga. Onye isi oche otu a bụ ‘Most Rev’. Augustine Akubeze, n’okwu ya na Monde gara aga kwuru na ndị uweoji na ndị ọlụ nchekwa ndị na-akwado ha so kpata mkpamkpa ahụ kpara na steetị Plateau bụ nke tara isi mmadụ karịrị otu nari. Ọ katọrọ ịghafu ọbara ahụ kpam kpam ma kpọkuo ndị uweoji ka ha gbakarịa nkịta n’ọsọ ma nwụchikọọ ndị kpara arụ ahụ ma kpupu h