Posts

Showing posts with the label Igba odibo

Igba odibo: Usoro obibi ndụ ndị Igbo (1)

NDỊ IGBO kwuru okwu si na onye fee eze, eze efee ya. O were buru ya, igba odibo so n’otu usoro obibi ndụ ndị Igbo. Onye gbachaa odibo, n’ikpeazụ o nwere onwe ya, zụba ndị ọzọ.   Igba odibo di n’ụzọ dị iche iche, ufọdụ na-agba odibo maka inye aka n’ọrụ ezinaụlọ, ụfọdụ na-agbakwa odibo ahia nke a na-akpọ ịgba ‘bọyị’ n’ala Igbo. Otu o sila di, odibo bụ mmadu ịnọ n’okpuru onye ọzọ na-eme ihe na ntuziaka onye ọ nọ n’okpuru ya.   A bịa n’igba odibo maka ọrụ ezinaụlọ,  ọtụtụ ụmụaka bido n’ihe dika agbata afọ ise ka a na-akpọpụ. Ụmụaka dị otu ahụ na-ahapu ezinaụlọ nne na nna ha were gaa na nke onye ha ga-agbara odibo. ọtụtụ n’ime ha na-eku nwa, otụtụ na-esi nri, ọtụtụ na-elekọta ndị okenye, tinyere ihe ndọ ọzọ.   Ụmụaka gara iku nwa na-anọ n’ụlọ ebe ahụ ha na-agba odibo kuo nwa, ha kuchaa ọ bụrụ na ọ dabara ha na ndị ha na-agbara odibo, ha ekuru nwa na-aga n’ihu. Ụfọdụ n’ime ha na-eku ụmụ abụọ, atọ, anọ maọbu karia. Ka ha na-eku ụmụaka ahụ, ha kwesiri idi na-agakwa akwụkwọ. Tupu ị mara ihe na-

Igba odibo n'oge ugbua

IGBA odibo bụ ihe dịbara gboo. O si n’aka nna nna anyị wee ruo anyị aka.   Odibo dị iche  n’ohu. Odibo bụ mmadụ ịhapụ ụlọ ya gaa biri be mmadụ, nọdụ n’okpuru onye ahụ ma na-asọpụrụ onye ahụ. Nke a pụtara na ọ ga-eme ihe nile nna ya ukwu gwara ya mee ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị. Iwu ji ya ịnọ n’okpuru nna ya ukwu. Ihe dị iche n’ebe odibo na ohu nọ bụ na odibo ga-emechaa nwere onwe ya, ma ohu na-anọgide n’okpuru nna ya ukwu.   E nwere ike gbuo ohu mgbe ọbụna.Odibo ọbụna chọrọ ibara onwe ya uru na-enwe nsọpụrụ na irube isi makana ndị Igbo kwuru okwu si na onye fee eze, eze e ruo ya.   Ana agba-odibo n’ụzọ dị iche iche. Ụfọdụ na-ahapụ be nne na nna ha mgbe ha dị na nwata gaa biri be onye ọzọ na-ejere onye ahụ ozi. N’ọnọdụ dị otu a, ọ bụ oke na ọlụ ndị ahụ ilekọta nwata ahụ anya dịka ọ na-agbara ha odibo.     N’ụzọ dị otu a, ezinaụlọ a ga-ahụ na nwata ahụ (odibo) ga-anọ n’aka ha topụta ihe e ji mmadụ eme ma bụrụkwa mmadụ n’obodo. Ụfọdụ ndị mmadụ e sila n’ụzọ dị otu a too, soro na ndị ọnụ ruru

Igba odibo n'oge ugbua

Chinwendu Uzoatu   IGBA odibo bụ ihe dịbara gboo. O si n’aka nna nna anyị wee ruo anyị aka. Odibo dị iche n’ohu. Odibo bụ mmadụ ịhapụ ụlọ ya gaa biri be mmadụ, nọdụ n’okpuru onye ahụ ma na-asọpụrụ onye ahụ.   Nke a pụtara na ọ ga-eme ihe nile nna ya ukwu gwara ya mee ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị. Iwu ji ya ịnọ n’okpuru nna ya ukwu. Ihe dị iche n’ebe odibo na ohu nọ bụ na odibo ga-emechaa nwere onwe ya, ma ohu na-anọgide n’okpuru nna ya ukwu.   E nwere ike gbuo ohu mgbe ọbụna.Odibo ọbụna chọrọ ibara onwe ya uru na-enwe nsọpụrụ na irube isi makana ndị Igbo kwuru okwu si na onye fee eze, eze e ruo ya. Ana agba-odibo n’ụzọ dị iche iche. Ụfọdụ na-ahapụ be nne na nna ha mgbe ha dị na nwata gaa biri be onye ọzọ na-ejere onye ahụ ozi. N’ọnọdụ dị otu a, ọ bụ oke na ọlụ ndị ahụ ilekọta nwata ahụ anya dịka ọ na-agbara ha odibo. N’ụzọ dị otu a, ezinaụlọ a ga-ahụ na nwata ahụ (odibo) ga-anọ n’aka ha topụta ihe e ji mmadụ eme ma bụrụkwa mmadụ n’obodo. Ụfọdụ ndị mmadụ e sila n’ụzọ dị otu a too, soro na n