Posts

Showing posts with the label Igba bọyị

Igba bọyị n'oge ugbua

ỊGBA odibo ma ọ bụ ịgba bọyị bụ ihe dịbara gboo. O si n’aka nna nna anyị wee ruo anyị aka.   Odibo dị iche n’ohu. Odibo bụ mmadụ ịhapụ ụlọ ya gaa biri be mmadụ, nọdụ n’okpuru onye ahụ ma na-asọpụrụ onye ahụ. Nke a pụtara na ọ ga-eme ihe nile nna ya ukwu gwara ya mee ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị. Iwu ji ya ịnọ n’okpuru nna ya ukwu. Ihe dị iche n’ebe odibo na ohu nọ bụ na odibo ga-emechaa nwere onwe ya, ma ohu na-anọgide n’okpuru nna ya ukwu.   E nwere ike gbuo ohu mgbe ọbụna.Odibo ọbụna chọrọ ibara onwe ya uru na-enwe nsọpụrụ na irube isi makana ndị Igbo kwuru okwu si na onye fee eze, eze e ruo ya.   Ana agba-odibo n’ụzọ dị iche iche. Ụfọdụ na-ahapụ be nne na nna ha mgbe ha dị na nwata gaa biri be onye ọzọ na-ejere onye ahụ ozi. N’ọnọdụ dị otu a, ọ bụ oke na ọlụ ndị ahụ ilekọta nwata ahụ anya dịka ọ na-agbara ha odibo. N’ụzọ dị otu a, ezinaụlọ a ga-ahụ na nwata ahụ (odibo) ga-anọ n’aka ha topụta ihe e ji mmadụ eme ma bụrụkwa mmadụ n’obodo. Ụfọdụ ndị mmadụ e sila n’ụzọ dị otu a too, soro na