Igba egwu
Uchenwa Mba IGBA egwu bụ otu ihe jikọrọ mba ụwa nile ọnụ dịka asụsụ siri jiko mmadụ ọnụ.Na mmalite ụwa na mgbe ochie,asụsụ ụwa gbara otu. Mgbe ha gabara otu Chukwu achọghị, Chukwu wee ghasa asụsụ ha. N’ihi na Chukwu hapụrụ mmadụ uche, ha chepụtakwa ihe ọzọ ga ejikọ ụwa ọnụ nke bụ igba egwu. Igbe egwu bụ ihe mba nile na-eme ma bụrụ ihe ọ ga abụ ilebe ka a na-agba ya, obi ụtọ amalite kpaba gị ma ịnụrụ asụsụ ha ji agụ ya ma ị nụghị.Ọ bụ ihe na-eme ka mmadụ chezọ mkpasu iwe ọ bụla. N’ ụbọchị Satodee bụ ‘April’ 29, a ga enwe ụbọchị ndị ‘International Theatre Institute’ wepụtara ka ọ bụrụ ụbọchị igba egwu na mba ụwa nile ga na emerube. Egwu bụkwa ihe mba ụwa nile ji emerube mmemme ha iji mee onwe ha obi ụtọ. Mba ụwa nile hụtara egwu dịka otu ihe na-amasi onye ọ bụla. Ọ bụ ya mere ‘International Theatre Institute’ jiri wepụta ‘April’ 29 afọ ọ bụla ka ọ bụrụ ụbọchị igba egwu. Egwu dị na ụdi na ụdi. E nwere egwu omenala, enwere egwu ọdinala dịka nke ndị Ohafia. Enwere egwu ụmụ agbọghọ,