Ndị Ifitedunu ekeleela Soludo maka iwètara ha udo
NDỊ obodo Ifitedunu, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Dunukọfịa nke steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, maka iweghàchite ọnọdụ udo n’obodo ahụ ka ọ gachara ahọ olenaole ha jiri nwebe nsogbu banyere ọchịchị obodo ahụ. Eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Emeka Ilouno bụ ya kwupụtara nke a oge o duru ụmụafọ obodo ahụ wee wụchaa n’obi gọọmenti dị n’Awka, bịa ịsị Gọvanọ Soludo daalụ maka ịzọbata ụkwụ na nsogbu ọchịchị obodo ahụ dịbara kemgbe, wee weta udo tọrọ àtọ n’obodo ahụ, site n’iweghàchi na iguzobegharị onyeisi ọchịchị (President-General) ndị obodo ahụ jiri aka ha họpụta. Ndị ahụ bugasị akwụkwọ e degasịrị ihe dị icheiche na ha, dịka ‘Daalụ Soludo’, ‘Soludo, I Mere Nke Ọma’, ‘Soludo, Onyeisi Udo’, na ụfọdụ ederede ndị ọzọ wee bịa n’ebe ahụ. N’okwu ya n’ebe ahụ, Igwe Ilouno kwuru na ọbịbịa ha ebe ahụ bụ otu n’ime ụzọ ha siri chọọ igosipụta obiụtọ ha banyere ihe ahụ Gọvanọ Soludo meere obodo ahụ, ma sịkwa ya jisie ike n’ọrụ. O mere ka a mara na nsogbu b