Idu obì n'ala Igbo: Oge mbụ na oge ugbua
IDU obì bụ otu n’ime ihe zuru Igbo ọnụ, ma bụrụkwa oge e ji asị nwata nwoke ”Lee nke a jide” n’ezinụlọ a mụrụ ya. Na nkọwa, idu obì pụtàrà nna ịkpọ ụmụ ya ndị nwoke, kèéré maọbụ nye onye ọbụla n’ime ha ala ebe ọ ga-arụ ụlọ nke ya, maka na a sị na ọ na-adị mma nwata toruo obi ọ pụọ obì. Ndị mba ọzọ dị icheiche nà agbụrụ ụfọdụ na-emekwa omenala idu obì n’ụdị nke ha n’ihi na ámá onye na-adị ka o siri chọọ ya. N’ala Igbo, idu obi abụghị naanị omenala, kama ọ bụkwa ihe ziri ezi, n’ihi na a sị na ihe onye ruru ogo ya wee rie ya, ọ bụghị akpịrị. Ọ bụ kwa ihe a mà ama na ọ bụrụ na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mere anụ n’ọkọchị na n’udummiri. Nke a mere na ndị Igbo ejighị idu obi egwu egwu, ọ kachasị n’oge gboo, maka na ha ghọtara na ọ bụrụ na nwoke edozighị ngwuru be ya n’oge, nsogbu ụwa edulaa ya mmụọ. N’oge gboo n’ala Igbo, nwoke ọbụla lụrụ nwaanyị na-ebu ụzọ gbàkọcháá ala ya na ihe o nwere, tupu o mara etu ya na nwunye ya ga-esi debe ọkpà wee gba egw