Posts

Showing posts with the label Ide mmiri

Ibenata mkpamkpa ide mmiri n’akpa n'ala anyị

MMIRI ozuzo dị mma maka na ọ bụ oge mmiri ozuzo ka eji akọnye ihe a ga-eri kwa afọ ọ bụla. Ọ bụkwa oge ihe nile dị ndụ ji ekute ume ndụ. Mmiri ozuzo dị mma mana oke mmiri ozuzo na-ewetara ihe ọ bụla na-eku ume oke ọdachi.   Ọ bụ n’ime oke mmiri ozuzo ka e si enweta oke ide mmiri bụ nke na-ewetara ihe nile ọ bụla oke ọdachị jọgbụrụ onwe ya. Ide mmiri pụtara mmiri juputara ebe nile na mberede, oge ụfọdụ ọ bụrụ n’oge ehihie ma ọ bụ oge abanị.   Ide mmiri bụ ihe enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ mana ọ na-akpa ike ọjọọ. Ọ na-eropụ osisi n’agbanye ka osisi ahụ ra, ọ na-akwatu ụlọ, ọ na-ebu mmadụ, na-ebukwa ụgbọala nakwa ọtụtụ mmekpa ahụ ọ na-ewetara mmadụ.   E wepu ụlọ, osisi, ngwa ahịa nakwa ngwo ngwo ndị mmadụ ide mmiri nwere ike I buru. Ihe ọzọ na-eweta ide mmiri jiri ebukarị mmadụ bụ enweghị ndidi. Mmiri na-ezo, ụfọdụ asị ka ha laba, ma ọ bụ ha ebilie, gaba ọlụ ma ọ bụ ahịa ma ọ bụkwa ebe ọ bụla dị ha mkpa. Oge ụfọdụ, ha ekwudo oke ide mmiri n’ụzọ. N’ihi na ha amaghị otu ụzọ ahụ dị na mbụ, tinye

Na Jigawa, ide mmiri egbuola mmadụ ruru iri abụọ na ise

OKE ide mmiri  egbuolammadụ dị ihe dịka iri abụọ na ise ma mebie ihe karịrị ụlọ dị puku iri ise naotu na Jigawa.   Gọvanọ MuhammadBadaru kwuputara nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na Dutse.   Gọvanọ ahụ kwuru naya enweghị ike ịkọwa ole ndị o metụtara n’ihi na ndị mmadụ na-anwụ na-aga n’ihudịka ya bụ mkpamkpa ka na-akparịrị.   Otu o sila dị, ọ kọwarana ihe ha gụtara n’ọnụọgụ ikpeazụ ha gụrụ nọ n’agbata iri abụọ na iri abụọ naise, ma rụtụkwa aka na a ka ga-eleru anya ịchọpụta ma ọ bụ iju mmiri gburu ndịahụ nwụrụ anwụ ka ọ bụ ihe ọzọ.   Badaru, onye kasiriezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ obi tinyekwara ndị tufuru ngwongwo ha jiri birin’ihi oke mmiri ahụ kwere ha nkwa nkwado nke gọọmenti ya.   Ọ gara n’ihu kwuo sị:“Ụfọdụ abụghị iju mmiri kama oke mmiri ozuzo mebiri ụlọ aja (mud houses) ndị beanyị nwere, ọ bụ otu a ka o si dị n’afọ a.”   O kwuru na iju mmiritokporo ọtụtụ obodo nke karịrị ya ịgazucha ma kwe nkwa ịkwado ndị niile ometutara ozugbo o nwetere ozi otu ihe siri dị site n’aka ndị k

Ide mmiri akpaala nnukwu ike ọzọ na Delta

NDỊ bị n’Asaba, isi obodo steeti Delta na gburugburu ya ka na-akwa arịrị n’ihi mkpamkpa ide mmiri kpara n’ebe ahụ n’ihi oke mmiri ozizo nke zoro abali atọ. Mmadụ abụọ ka e kwuru na ha tufuru ndụ ha n’ihi ya bụ ọdachị. Ha bụ otu nwoke nọ n’agbata etiti (middle aged) na nwata nwaanyị dị afọ iri. Oke ide mmiri buuru nwoke ahụ (Hassan) n’ike, ọ bụ eziokwu na a gbalịrị zọpụta ya ma ọ nwụkwara ozugbo. Nwata nwaanyị ahụ bụ onye nke e kwuru na nne na nna ya adịlarị na mbụ nwụọ, danyere n’ime ide mmiri n’Okpanam ebe o buuru ya tinye isi n’ọwa mmiri a na-alụ ọhụrụ n’okporoụzọ sị Okpanam gaa Asaba tupu ọ tụhapụ ozu ya n’otu ebe. Ọtụtụ ndị mmadụ kwara arịrị ka mmiri siri chụpụ ha n’ụlọ ma mebichaa ngwongwo niile ha jiri biri. Otu onye ọlụaka aha ya bụ Chika Onadeko kwuru na ide mmiri ahụ kpara ike dị egwu. Ọ kọwara na ha ka nọ n’ọlụ oge ọ malitere, wee buru ọtụtụ ngwongwo o ji alụ ọlụ. N’okporoụzọ gara ‘Delta Broadcasting Service’ (DBS) bụ redio steeti ahụ, otu akụkọ ahụ ka a na-akọ. Ide mmiri kwo

Ndị Red Cross enyela ndị ide mmiri chupụrụ n'ụlọ ihe onyinye

NDỊ ọlụ na-eleba anya maka ọdị mma mmadụ ‘The Nigerian Red Cross Society’ site na njikọ nke ndị otu ahụ, ngalaba ofesi azala oku gọọmentị steeti Anambra site n’ịgbatara ndị ide mmiri chụpụrụ n’ụlọ ọsọ enyemaka. Ha butere ihe onyinye gburu ego karịrị nde naira ise. E kere ihe onyinye ndị ahụ n’obodo dị iche iche mmiri chụpụrụ n’ụlọ. Mgbe a na-enyefe ihe onyinye ndị a n’aka ndị okpuru ọchịchị Anambra ‘West’ na ‘Bishop Crowder Holding Centre, Onitsha’ ka osote onyeisioche otu ‘Nigerian Red Cross’ bụ Ọkammụta Peter Katchy, kwuru na ya bụ ihe onyinye nke ndị ‘European Union’ kwadoro bụ iji nye aka maka mkpa mkpa ide mmiri kpara. Ọ kọwapụtara na otu ha, nke bụ maka ọdị mma mmadụ ga na-aga n’ihu n’igbata ọsọ enyemaka na steeti Anambra. N’akụkụ nke ya, ode akwụkwọ otu ahụ bụ Kingsley Okoye dụrụ ha ọdụ ka ha were ihe onyinye ndị ahụ mee ihe dịka o kwesiri. Otu nwanyị dị ime aha ya bụ Blessing Ojadi na Christopher Nwayibe, bụ  kwuru na ha tufuru ihe nile ha nwere n’aka ide mmiri gosiri afọ ojuju

E butela ozu mmadụ abụọ idè mmiri gbàgbùrù n'obosi

DỊKA a sị na chi na-abọ, ihe ọma na ihe ọjọọ ana-abọ, ndị uwe ojii na mpaghara Obosi nke steeti Anambra ahụla ma bute mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ide mmiri gbàgbùrù na mpaghara Odume nke Obosi dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Garba Umar, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kọọ na a hụrụ mmadụ abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị ka ha tọgbọ na mpaghara Odume ahụ, nke mezịrị ndị ọlụ uwe ojii na mpaghara Obosi ahụ jiri gbara gaba ebe ahụ ozigbo ozigbo. Dịka o siri kwuo, ngwa ngwa ahụ, ha buuru mmadụ abụọ ahụ gaba n’ụlọ ahụike ‘Unity Hospital’, bụzị ebe dọkịta nọ wee lelechaa ha ahụ, ma fechaa isi, sị na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya. O kwuru na site n’obere nnyocha e megoro, na a achọpụtara na ọ ga-abụ idè mmiri gbàgbùrù ndị ahụ n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ  kwọsịrị n’ebe ahụ ụbọchị Satọdee, bụkwa nke gbara oke ide mere mkpamkpa na mpaghara ebe ahụ niile ụbọchị ahụ. Maazị Ụmar jizịkwara ohere ahụ kpọk

Ide mmiri agbagbuola nwata nwoke ọzọ n'Anambra

IDE mmiri eriela nwata nwoke gbara afọ iri abụọ n’Ogbetiti Odoekpe dị n’okpulo ọchịchị Ogbaru, nke aha ya bụ Ifejika Umuiza. Onyeisioche ‘Transition Committee’ nke okpuru ọchịchị Ogbaru, Arinzechukwu Awogu, kwupụtara nkea n’Awka na Tuzdee. Awogu kwuru na mmiri buuru Ifejika tunye ya n’ime nnukwu ọdọ mmiri nke dị n’akụkụ ezinaụlọ ha nke dị n’Ochuche Umuodu, Ogbetiti Odaekpe, ebe ha bi. Ya bụ onyeisioche kwuru na ya na ndị ọzọ gọọmentị họpụtara akpọtụrụla ezinaụlọ ahụ ma tie ha aka n’obi maka ya bụ ọdachi. O wutere ya na ha atufuola ọtụtụ ndụ n’ebe ahụ maka ide mmiri. Ọ gara n’ihu kwuo na ọnụọgụ ndị tufuru ndụ ha n’ọnọdụ ahụ dịzi iri na otu. O kwuru si, “mmiri riri Ifejika n’akụkụ ezinaụlọ ya ebe ide mmiri dị n’azụ ụlọ ha buuru ya tunye n’ime ọdọ mmiri dị ebe ahụ. Nke a mere n’Ochuche Umuodu. “Ọnwụ Ifejika wetara ọnụọgụ ndị mmiri rigworo kemgbe afọ 2018 nsogbu a bidoro n’ogo iri na otu.”

Ndị ọlụ ugbo ebee akwa maka mkpamkpa oke ide mmiri

OKE iji mmiri nke gbara n’afọ a, ewerela ebe ndị mmadụ bi na ebe a na-akọ ọlụ ubi,mebie akụ na ụba nke a na pụghị ikwu ọnụ ahịa ya . Ndị ihe ndịa kasi njọ bụ ndị ọlụ ugbo na ndị bị nso na akụkụ osimiri Niger na osimiri Benue na Nigeria. Ihe butere oke iji mmiri nke a bụ na mmiri gafere akụkụ osimiri abụọ ahụ wee kwonye n’ebe ndị mmadụ bi na n’ebe a na-akọ ọlụ, wee mebie akụ na ụba obodo. Otu mmiri siri wee rie obodo ndị bị n’akụkụ osimiri, ụlọ dị n’ime ha, bụ oke ihe ịtụ n’anya n’ihi na e jisike ahụ ụlọ ụfọdụ anya. Ihe nile nke dị n’ime ụlọ ndị a abugoro ihe mebiri emebi. Ihe nile eji ebi n’ụlọ dịka akwa, ite, oche na nri dị iche dị n’ime ụlọ ahụ emebiela, o wee bụrụ oke ihe ọghọm n’ebe obodo ndị a na ezinaụlọ dị n’ime ha. Na steeti anyị bụ Anambra, gọọmentị ime obodo o metụtara bụ Ogbaru, Anambra West, Anambra East, Onitsha North, Onitsha South, Ayamelum na Awka North. Obodo nile nke dị n’ime Anambra West abụgoro ihe mmiri tochiri nke mere na gọọmentị etiti zitere osote onye isi ala N

Ide mmiri awakpola obi eze Umueri

ONYE eze odinala nke Umueri n’okpuru ọchịchị Anambra ‘East’ na steetị Anambra bụ  Igwe Bennett Chukwuemeka, akwaala arịrị maka nsogbu ide mmiri na-akpa be ya. O kwuru n’otu ụlọ na be ya abụrụla nke ide mmiri tokporo. Ọ gara n’ihu kwue na ndị Umueri nile bi n’akụkụ mmiri bụkwazi ndị nke ahụ metụtara tinyekwara na mmiri tokpokwara ubi, ụlọ na ọtụtụ ihe ndị dị iche iche. Onye eze ahụ, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, kọwara na ide mmiri tochiri ala ubi karịrị otu narị na iri isii bụ ebe a kọrọ akpụ; mebikwaa ala ubi ebe a kọrọ osikapa. O kwuru na ya akpọkuola ndị ọ dị n’aka bụ ‘Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)’ gbasara ya bụ ike ide mmiri na-akpa mana ka ihe siri gbata kwụrụ, na ya ahụbeghị ha. Igwe Chukwuemeka gakwara n’ihu kwuo na gọọmentị steetị Anambra ewepụtala ọtụtụ ebe dị iche iche n’okirikiri ahụ bụ ebe ndị ide mmiri chụpụrụ n’ụlọ ga-agbaga ọsọ ndụ, mana dịka ọnọdụ ebe ahụ siri dịrị, ndị mmadụ achọghị ịnọ na ya. Ọ rịọrọ gọọmentị steetị Anambra ka o mepee ebe ọzọ n’Ama

Anambra ewepụtala ebe a ga na-atụkọta ihe maka ndị iju mmiri chụpụrụ be ha

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra eweputala ebe dị iche iche a ga na-anakọ ma ọ bụ na atụkọtakwa ihe dị iche iche maka ndị ahụ ìjú mmiri chụpụrụ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’aka kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkọwatara ọhanaeze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adịnụba, site n’ozi ọ kụpụrụ nso nso a, bụkwa nke gara n’ihu kọwaa na ndị ahụ ìjú mmiri chụpụrụ na be ha chọrọ ọtụtụ ihe enyemaka dị iche iche ugbu a, nke gụnyere ihe oriri na ihe ọñụñụ, àkwà edina, úté, ákwà, ihe e ji esi nri nakwa ọtụtụ ihe enyemaka ndị ọzọ e ji akwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ndị ahụ. Dịka ya bụ ozi siri wee kọwaa, ebe ndị ahụ e wepụtara maka ịnakọ ihe ndị ahụ gụnyere: isi ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadị, bụ ụlọ ọrụ “Anambra State Emergency Management Agency” (SEMA) dị n’Awka, n’okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịsha. Ebe ndị ọzọ bụzị n’isi obodo okpuru ọchịchị Ayamelụm, ‘Anambra East’, ‘Anambra West’, Ọgbaru, ‘Ọnịtsha South’, ‘Ọnịt

Anambra: Akwụsịla inye ndị ide mmiri na-enye nsogbu ọkụ latrik

MAAZỊ Arinze Awogu, onye isi oche  okpuro ọchịchị Ogbaru’ nke Anambra steeti agwala ndị ụlọ ọlụ ‘Enugu Electricity Distribution Company(EEDC) ka ha kwụsị inye ndị mpaghara ahụ ide mmiri na-enye nsogbu ọkụ n’ihi ụjọ ọnwụ ndị mmadu maka ọkụ latrik. Awogu gwara ndị nta akụkọ n’Awka na ọtụtụ akụrụngwa eji enye ọkụ latrik nke n’alụ ọlụ na mpaghara ahụ bụ nke ewepụsiri n’ihi mmiri na- ezo akwụsi akwụsi. O kwuru na opekata mpe, na mmadu puku iteghete si na ezinaụlọ otu puku na nari atọ bụ ndị anọghịzi n’ụlọ ha n’Ogbaru. Awogu kwukwara na e nwere ihe egwu nke nwere ike ibute ihe mmerụ ahụ nyere ahụ ike dịka ọtụtụ ebe nsị na abanye bụrụgworo nke mmiri kwughepụrụ. Ọ kọwara ọnOdụ ịju mmiri n’Ogbaru dịka nwakpo nke kwesiri ka ewere ọsọ wee za ha site na ndị ‘National’ na Anambra ‘State Emergency Management Agencies’. “NEMA,SEMA na ndị isi ‘Red Cross’ agaala Ogbaru maka ịhụ ebe ihe ndi a mere,anyị ka na eche nzọpụta ha iji wetuo itufu ndụ na ngwo ngwo e ji ebi n’ụlọ”. “Anyi ga-aga n’ụlọ ndị mmadụ n

SEMA na ndị ọlụ agha ejikọọla aka ibuso ide mmiri agha n'Anambra

DỊKA a gara n’ihu na-ama ọkwa ma na-ebukwa amụma dị iche iche banyere mkpamkpa dị iche iche ìjú mmiri aghaghị ịkpa na steeti dị iche iche n’ahọ a, ndị ọrụ agha ala anyị ekwela nkwà ma kwupụta njikere ha ijikọ aka ọnụ, ha na ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ọnọdụ mberede na steeti Anambra, bụ Anambra State Emergency Management Agency, n’ibuso nsogbu iju mmiri agha na steeti ahụ. Nkwekọrịta njikọ aka a bụ nke e mere n’isi mbido izuụka a, dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nwechara nkenke nzukọ n’ebe obibi ya dị n’Amawbịa, ya na ndị ụlọ ọrụ SEMA na òtù ngalaba ọrụ agha ala anyị na-ahụ maka ịgbata ọsọ n’ọnọdụ mberede. Nzukọ a bụ otu n’ime nzukọ weere ọnọdụ na steeti ahụ nso nso a dịka onye ndu ọhụrụ nke mpaghara ’82 Division’ nke ọrụ agha ala anyị, bụ ‘Majọr General’ Emmanuel Kabuk bịarutere steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụpụtasịa atụmatụ dị iche iche etu ha bụ ndị ọrụ agha ala anyị ga-esi nye aka n’ibuso ide mmiri aka na steeti ahụ. N’okwu ya na nzukọ ahụ, Gọvanọ

Ịgbochị mkpamkpa ide mmiri n'ala anyị

Uchenwa Mba   MMIRI ozuzo dị mma maka na ọ bụ oge mmiri ozuzo ka eji akọnye ihe a ga-eri kwa afọ ọ bụla. Ọ bụkwa oge ihe nile dị ndụ ji ekute ume ndụ. Mmiri ozuzo dị mma mana oke mmiri ozuzo na-ewetara ihe ọ bụla na-eku ume oke ọdachi. Ọ bụ n’ime oke mmiri ozuzo ka e si enweta oke ide mmiri bụ nke na-ewetara ihe nile ọ bụla oke ọdachị jọgbụrụ onwe ya. Ide mmiri pụtara mmiri juputara ebe nile na mberede, oge ụfọdụ ọ bụrụ n’oge ehihie ma ọ bụ oge abanị. Ide mmiri bụ ihe enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ mana ọ na-akpa ike ọjọọ. Ọ na-eropụ osisi n’agbanye ka osisi ahụ ra, ọ na-akwatu ụlọ, ọ na-ebu mmadụ, na-ebukwa ụgbọala nakwa ọtụtụ mmekpa ahụ ọ na-ewetara mmadụ. N’izu ụka gara aga, anyị nụrụ ka ide mmiri siri buru ụgbọala na ndị no n’ime ya. Ndị nọ n’ime ụgbọala ahụ bụkwa ozu ha ka a hụrụ n’ikpeazụ. Ọ dịkwa mgbe ụlọ ọlụ nta akụkọ ‘Sun’ buru akụkọ maka otu nwaamadi bi na Lagos ide mmiri wakporo ụlọ ya ma gbagbuo ụmụ ya atọ na ihe ndị ọzọ o mebiri. N’afọ gara aga, ide mmiri buuru otu nwata e dunye

Ide mmiri agbagbuola mmadụ anọ n'Ọnịtsha

kpaa mkpamkpa n’Okpoko Izunna Okafor dere akụkọ a   Nnukwu ihe egwu dara nnọọ n’Ọnịsha, steeti Anambra, n’izuụka gara aga, dịka oke idè mmiri gbàgburu mmadụ anọ ndị ọrụ ụlọ akụ ma tigwosiekwa ọtụtụ ụgbọ ala, n’ihi oke mmiri ozuzo kwọsịsịrị n’obodo ahụ, bụkwa nke zoro ọtụtụ oge . Mmadụ anọ ahụ, ndị a kọwara dịka ndị na-arụ n’otu ụlọ ọba ego dị na mpaghara ahụ, bụ ndị e kwuru na ha chegidere ka mmiri ozuzo ahụ kwụsị ma ọ chọghị ịkwụsị wee rukwaa oge ha mechiri ọrụ, nke mezịrị ka ha kpebie ibu ya wee laa; ha anọ wee bàkọọ otu ụgbọala, bụkwazị nke oke ide mmiri buchaara n’okporo ụzọ oge ha na-ala, ma sụnye ya isi n’otu ọwà mmiri chere ihu n’ohimiri Niger, ebe ha nọzịrị wee ghọrọ ozu. Dịka otu onye ọnọ mgbe o mere siri kwuo, mmadụ anọ a, tinyere otu nwata nwaanyị bụ ndị a hụrụ n’ime ụgbọala ahụ ka ha nọ n’egwù ma na-agbakerị ala ịzọta onwe ha n’ihi na ide mmiri ahụ asachiela iro niile, mana o nweghị ihe ha pụrụ imeta banyere nke ahụ, wee ruo oge ọ sụnyere ha isi n’ọwà mmiri ahụ, bụ nke ímì

Ide mmiri a gbabuela nwa a mụrụ, tufue n'Ifite Awka

Izunna Okafor   N’IHI na a sị na chi na-efo, ihe ọjọọ a na-abawanye; ụbọchị ụka gara aga bụ nnọọ ụwa bịa lelee n’Ifite Awka dị n’okpuru ọchịchị Awka South nke steeti Anambra, dịka a hụrụ ozu nwatakịrị a mụrụ ọhụụ ma kechie ya n’àkpà n’ụsọ ebe ide mmiri si aga, n’okporo ụzọ ahụ siri Ifite wee gaa Mahadum Nnamdị Azikiwe.   Ya bụ ozu nwata na akụkọ so ya bụ nnọọ nke na-awụ akpata oyi, dịka otu onye akaebe na-akọwa na a tọgbọrọ nwatakịrị ahụ mgbe ọ ka dị ndụ, mana ide mmiri gbàgburu ya ma buruzie ozu ya sụtọba ya isi n’ọwà mmiri dị n’akụkụ okporo ụzọ ahụ, ka ụwa wee lelee.   N’okwu o kwuru ka a na-agba ya ajụjụ ọnụ, otu nwoke na-ere ahịa na mpaghara ebe ahụ, bụ onye ekweghị ka a mara aha ya kọwara nke ahụ dịka ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuokwa nkakwụ n’isi, ma katọọ ajọ akparamagwa na nzuzu ụfọdụ ụmụnwaanyị, bụ ndị o kwuru na egwu Chineke adịghị n’ime ha ma ọlị. O kwuru na ọ bụ nanị onye enweghị uche, onye arabanko ma ọ bụ nwata nwanyị amaghị uru nwa bara pụrụ ime ụdị ihe ahụ.   Onye a

Ide mmiri agbagbuola otu nwatakịrị n'Onịtsha

Izunna Okafor     N’IHI nnukwu mmiri ozuzo malitegoro ịkwọsịsị n’ebe dị iche iche ugbu a, oke ide mmiri àgbàgbuola otu nwatakịrị gbara naanị afọ asatọ n’Ọnịtsha ma tụpụta ozu ya n’elu ala ka ụwa wee kirie.Oke ihe mwute a bụ nke weere ọnọdụ n’isi ngwụcha izu ụka gara aga, ebe ozu nwatakịrị a aka ya dị ọcha bụzị nke a hụrụ na mpaghara ụzọ ahịa ochie, dị n’akụkụ nkwụsị ụzọ Egerton.   Dịka ndị bi na mpaghara ebe ahụ siri kọọ, nwatakịrị ahụ, onye aha ya bụ Ọlụebube Nwanedo, bụkwa nwata akwụkwọ nọ n’ogo praịma nke anọ ya n’ụlọ akwụkwọ “Holy Child Primary School Onitsha” ma bụrụkwa nwa mbụ nke Mazị na Oriakụ Nwanedo, bụ ndị sitere n’Obodo Ụmụezike nke dị n’okpuru ọchịchị Ọrlụ na steeti Imo.   N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, nne nwata ahụ, bụ odozi akụ Amaka Nwanedo, bụ onye anya mmiri na akwa arịrị ekweghị kwuo okwu nke ọma, kọwara na nwa ya nwanyị si ebe ha gara ọmụmụ ihe n’ụlọ ụka wee na-abata, ka oke mmiri ozuzo ahụ zochaara, ide mmiri wee buru akpụkpụ ụkwụ ya, ma burukwazie ya onwe ya ozig