Posts

Showing posts with the label Ide leta

Ide leta bụzi ihe mgbe ochie

N’IHE dịka afọ iri atọ gara aga, ide leta bụ ihe na-enye ọńụ. I cheta na ị ga-edegara onye nke gị nọ ebe dị anya leta, obi a na-atọ gị ụtọ. Nke a na-egosi na onye ahụ maara ihe ọ gara n’ụlọ akwụkwọ. Ezinaụlọ ọbụla e nwere nwata maara ede leta, ndị okenye ụmụ ha nọ ebe dị anya na ndị ụmụ ha amaghị ede ga na-abia ayọ ka onye ahụ dere ha leta ka ha zigara ndị nke anọghị nso.N’oge ahụ, ọ bụrụ na ị maara ede leta, ị ga-abụ onye a maara nke ọma n’obodo unu.   Ide leta bụ usoro e ji ezikọrịta ozi n’ihe dịka afọ iri atọ gara aga. N’oge ahụ, ekwentị nke a na-eji n’aka adịbeghi n’ala anyị. Nanị ekwe ntị nke na-adị n’elu okpokoro (table) bụ ihe dị. Ị chọọ ka gị na onye nke gị nọ ebe dị anya kparịta ụka ma ọ bụ izi ya ozi, ma ọ bụ ịkpọ ya ka ọ bịa,ị dee ihe nile ahụ ị chọrọ ị gwa ya n’akwụkwọ, were ya gaa n’ụlọ ọlụ a n-akpọ ‘post office’,goro mpekere akwụkwọ a kpọrọ ‘stamp’ mado n’akwụkwọ nke a kpọrọ ‘envelop’, tinye ya n’ebe e mepere a na-etinye ya. Oge ahụ, ọ na atọ ụtọ ma ọ bụrụ na ị gaa tinye