Ichu mmiri/iyi akwa
ICHU mmiri/iyi akwa (cloth) bụ mmadụ ikpokoro akwa ya gaa na mmiri nọrọ wee sụọ ya. A na-emekarị nke ahụ oge gara aga, mgbe mmiri dị ụkọ. N’oge ahụ, sọọsọ na mmiri a na-echu echu ka e si enweta mmiri. Onweghị ihe dịka pọmpụ maọbụ mmiri a gbapuru agbapu nke e ji enwe ụgbọala tanka na-agbatara ndị mmadụ mmiri. Ya mere, ma mmiri e ji esi nri, ma nke e ji asa ahụ tinyere ihe ndị ọzọ e ji mmiri eme bụ na mmiri ka e si enweta ya. Ọ bụ n’ihi ọnọdụ ahụ ka ndị mmadụ ji echu mmiri akwa n’oge ahụ, Ọ na-eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mfe n’ihi na kama ị ga-eji mmiri i kutere na mmiri sụọ akwa n’ụlọ, ọ kazie mma na I kpokọọrọ akwa niile ị chọrọ ịsụ gaa na mmiri sụọ ya. Otu o sila dị, ọ pụtaghị na anọghị n’ụlọ asụ akwa, kama ihe mere bụ na ndị mmadụ na-asụkari akwa na mmiri n’oge ahụ. Onye sụchaa akwa na mmiri, ọ kpasaa ya, ọ nọrọ ebe ahụ na-akọ. N’ihi na akwa ha bu aga na mmiri na-ebu ibu, ihe ha na-emekarị bụ onye na-asụ ọ na-akpasa ndị ọ sụtara; ọ sụchaa, ọ saa ahụ ebe ahụ, zuo ike, kwado ụla.