Posts

Showing posts with the label Ibadan

N'Ibadan, ndị arịrịọ emeela ngagharị iwe maka njọ ahịa

NDỊ arịrịọ dị ihe dịka narị abụọ na iri ise (250) n’ọnụọgụ emeela ngagharị iwe n’Ibadan isi obodo steeti Oyo wee katọọ otu njọ ahịa si ajọzị ha n’ike n’ike dịka ndị mmadụ anaghị atụnyekebeziri ha n’ihi akụkọ a na-akọ na ndị ọgaranya na-egoro ha ego ha rịọtara n’arịrịọ iji were gwọọ ọgwụ.   Dịka onye okwuputa okwu ndị ahụ onweghị ka ọ ha (destitudes) bụ Imam Abubakar Abdullahi siri kwu, ọnọdụ ahụ butere nnukwu ikpọ asị n’ebe ndị nke ya nọ.   Abdullahi kwuru sị: “Akụkọ na ụfọdụ ndị ọgaranya na-egoro ndị arịrịọ tinyere ndị nwere ọlụsị (physically challenged) ego maka ọgwụ ego abụghị eziokwu. N’ihi na e kwuru na ndị na-agwọ ọgwụ (ritualists) na-egoro ego site n’aka ndị arịrịọ, ndị mmadụ akpọọla ndị arịrịọ a aka ha dị ọcha asị. Ihe anyị maara bụ na ndị na-azụ ahịa, ndị ahịa mbugharị na ndị na-akwọ ụgbọala e ji eme njem na-abịakwute ndị arịrịọ a, bụkarịrị ndị kpuru isi na ndị ngwọrọ iji gbanwee ego. Anyị bịara ngagharị iwe a iji were zọpụta aha anyị, ka ndị mmadụ ghara ịta anyị ahụhụ n’ihe