Nsogbu ndị mmadụ na-ahụ n'inweta PVC

Chinwendu Uzoatu dere ozi a ỌTỤTỤ ndị mmadụ ekwuola na ọ na-esiri ha ike iweta akwụkwọ ikike e ji atụ vootu (PVCs). Dịka anyị maara na oge-atụlị akwụwkọ vootu iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala Nigeria. Otu nwote rụtụrụ aka na ihe gwụrụ ya ike n'ọnọdụ iweta akwụkwọ ikike e ji atụ vootu bụ igbu oge nke na-esite n'aka ndị ọrụ na-ahụ banyere ya. O kwuru na ị kwụ n'otu ọgbara, tinyere isite n'otu ọnụ abanye n'ụlọ ebe a na-eme ya gwụrụ ya ike. O kwuru na nje ahụ na-eme ka ebe ahụ na-ekwo ekwo ma na-agbakasị mmadụ ahụ. Onye ọzọ rụtụrụ aka na enweghị ndị nche n'ebe ahụ a na-eweta akwụkwọ ikike vootu mere ka ọnọdụ dịwanye njọ n'ihi na nke ahụ na-eweta ndị mmadụ ịkwogharị ekwogharị. N'akụkụ nke ya, Oriakụ Chika kwuru na ịtụ vootu bụ oke na ọrụ dịịrị onye ọbụla ruru afọ iri na asatọ n'ala anyị. Ọ rụtụ aka na nke ahụ bụ ụgwọ mmadụ ji ala nna ya. Ya mere, o kwuru na ngharịpụ INEC na-agharịpụ ndị mmadụ site n'enyeghị ha akwụkwọ ikike a