Posts

Showing posts with the label IFAD-VCDP

FGN/IFAD VCDP agbapeela ahịa ọhụrụ n'Azia

ÒTÙ ‘International Fund for Agricultural Development Value Chain Development Programme’ (a maara n’aha mkpìrìsì dịka IFAD VCDP) nọrọ na nsonso a wee gbapee agadaga ahịa abụọ gburu ego ruru nde naịra iri abụọ na ise a rụrụ n’obodo Azịa dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ihiala nke steeti Anambra.   Ya bụ agadaga ahịa abụọ a rụrụ n’ahịa Obom Azịa nwèrè ụlọahịa ruru iri na anọ n’ime ya, ma nwekwa ebe a na-aga mposi.   N’okwu ya oge ọ na-agbape ahịa ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti Anambra, bụ Maazị Nnamdi Onukwuba, nke onye nọchitere anya ya bụ onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ọrụ ugbo, bụ Maazị Obioma Mbanefo gwara ndị obodo ahụ ka ha lekọta ihe ahụ anya nke ọma. Ọ gwakwara ndị ritere uru n’amụmà FGN/IFAD VCDP ka ha jiri ya bàárá onwe ha uru ma kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba ha.   Na ntụnye nke ya, onyeisi nlekọta FGN/IFAD VCDP n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Nnamdi Agwuncha kwere nkwà na ha ga-aga n’ihu inye ndị ahụ nkwàdo, ọkachasị site n’ịrụrụ ha ogige e

VCDP atụgharịala ọnọdụ ọrụugbo n'Anambra – Agwuncha

IJI kwado ndị ọrụugbo maka inwetawanye uru n’ihe ha na-arụpụta, ọ kachasị osikapa na akpụ n’ala anyị niile, gọọmenti etiti n’afọ 2014 nwetara ụlọọrụ International Fund for Agricultural Development (IFAD) na Value Chain Development Programme (VCDP) ka ha nyere ndị ọrụugbo aka n’ego na nkwalite (capacity building).   Dịka onye nhazi (state programme coordinator) VCDP steeti Anambra, Nnamdi Agwuncha si kwu, gọọmenti etiti, gọọmenti steeti na IFAD bụ òtù atọ na-akwado àmùmà (programme) ahụ bụ nke dị kemgbe afọ asaa. Ọ malitere na gọọmenti okpuru ọchIchị ime obodo (local government) isii, bụ ndị a họpụtara site na mbọ ha n’ịkọpụta osikapa na akpụ. Gọọmenti ime obodo ndị ahụ gụnyere Ayamelum, Anambra West, Anambra East, Awka North na Orumba North.   Àmùmà ahụ nke ebumnuche ya mbụ na mbụ bụ ibelata ụbịam agbanweela ọtụtụ ndụ ndị mmadụ, kwalite uru ndị na-esonye na ya (participants) dịka ndị na-akọpụta ya (producers), ndị na-eme ihe dị na ya (processors) na ndị na-ere osikapa na akpu ma na-ahụ

IFAD-VCDP ekesàárala ndị ọrụ ugbo Anambra mkpụrụ akụkụ

N’IJI kwàdo ha n’ezi ọrụ ha ịhụ na a nwere nri gbàà-nyụụ nasteeti Anambra, òtù na atụmatụ ọrụ ‘International Fund for AgriculturalDevelopment assisted Value Chain Development Programme (IFAD-VCDP)’ ekesàáralandị ọrụ ugbo steeti Anambra mkpụrụ akụkụ ọrụ ugbo dị iche iche.   Mkpụrụ akụkụ ọrụugbo ahụ bụ nke mkpokọta ọnụ ego ya ruru puku kwùrú puku naịra, ma bụrụkwa nkee kesààra ndị ọrụ ugbo sitere okpuru ọchịchị ime obodo asatọ n’ime steeti ahụ,bụ ndị nọ n’okpuru atụmatụ IFAD-VCDP na gọọmenti etiti.   Mmemme ikesà ihe ahụbụ nke weere ọnọdụ n’Atanị, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ọgbaru, ma bụrụkwanke a nọrọ na ya wee gbapee atụmatụ nkesà mkpụrụ akụkụ ọrụ ugbo ndị IFAD-VCDPnke ahọ 2020 na steeti Anambra.   N’okwu ya oge ọna-agbape atụmatụ ikesa ihe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ WillieObianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steetiahụ, bụ Maazị Nnamdi Onukwuba kọwara nke ahụ dịka otu ụzọ pụtara ìhè a pụrụ isikwàdo ọrụ ugbo n’ime steeti ahụ.   Ọ dọr