Posts

Showing posts with the label ICC

Ndị omeiwu Anambra gara leta ụlọ ezumeezu ICC a na-arụ n'Awka etoola etu o si aga

Image
ỤFỌDỤ ndị omeiwu steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee bàgide njem nleta n’ogige ebe ahụ a na-arụ ụlọ ezumezu mba ụwa n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ.   Njem ahụ, nke ọ bụ ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor duru ha wee bàgide, bụkwà nke ụfọdụ ndị dị iche iche selitere isi n’ọrụ gọọmentị n’ime steeti ahụ sonyere na ya.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Maazị Okafor gosipụtara afọ ojuju ya banyere etu ọrụ si aga n’ebe ahụ, ogoogo e ji arụ ya bụ ọrụ, nakwa ogoogo ụlọ ahụ nọ na ya ugbua, ma kọwaa na eserese na atụmatụ e jiri rụọ ya bụ ụlọ bụ ụdị nke a na-ahụta na mba ofesi.   Dịka ọ na-akpọpụtasị uru dị iche iche ya bụ ogige ga-ewebàta na steeti ahụ ma a rụchaa ya, ọ gara n’ihu mee ka a mara na nke ahụ ga-enyekwa aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe na steeti ahụ, kewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, ma kwalitekwa ọnụego na-abata n’akpa gọọmenti steeti ahụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta.   O kwupụtara olileanya o nwere na a ga-arụcha ya bụ og