Cater ekesaara ndị Aguata ihe enyemaka maka korona
ONYE na-anọchite anya ọgbọnta vootu Aguata 1 n’ụlọ nzukọomebe iwu steeti Anambra (Anambra State House of Assembly) Hon. Dr. Cater DikeNnamdi Umeh ekesakwaala ihe enyemaka ọzọ maka korona na wọọdụ iteghete nkemejuputara ọgbọnta vootu Aguata 1. Nke ahụ bụ agba nke atọ ya ọ na-eme kemgbekorona jiri malite. Nkesa lhe ndị ahụ bụnke a haziri n’ụzọ bụ ịgba kpalitere aṅụrị na ịgọ ọfọ ọma n’ime ndị mmadụ. N’okwu ya mgbe a nọn’emume ahụ, Hon. Umeh kọwara na n’agbanyeghị ihe isiike n’oge ugbu a n’ihi korona na ya gbara mbọ inyere ndị ọ na-anọchiteanya ha aka, ma rụtụkwa aka na ya na-etinye Aguata 1dịka nke mbụ n’ihe ọbụla yana-eme. Ọ gara n’ihu kọwaana ya kesara agba mbụ nke ihe enyemaka ahụ site n’aka ndị kanselọ mejupụtara ọgbọntavootu Agụata 1, ma bụrụ ihe ndị gụnyere puku kwuru puku sanịtaịza, ihe e jiekpuchi ihu (face masks) na ihe ndị a na-agba n’aka (glooves) ma tinyekwarankuzi na mgbazi nke a haziiri ọha mmadụ niile banyere ihe ha kwesịrị ịma makansogbu korona (intensive sensitizati