Ndị ndu Ayamelum akwàdóla Ọkaokwu Anambra màkà ije n’ụlọ iwu ọzọ
ÒTÙ a maara dịka ‘Ayamelum Leaders of Thought’, bụ́ otu kachasị elu n’okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum nke Anambra steeti, nke bụ́kwa okpuruọchịchị na ọgbọ nta nkwàdó nke Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ́ Rt. Hon. Uchenna Okafor, ekwuputala mkpebi ha na nkwàdó ka nwa amadi ahụ gaghachi azụ ga nọ̀chitekwa anya ha ozo n’ụlọ omeiwu ahụ na ntuliaka izugbe ahụ na-abịa n’ihu. Onyeisioche ndị òtù ahụ, bụ́ Chiifu Sir Tony Chinedu kwupụtàrà nke a oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụọnụ na nsonso a n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, bụ́ ebe ọ nọrọ wee mee ka a mara mkpebi nà ebe ndị òtù ahụ kwụ̀ n’ihe gbasara onye ga-anọ̀chite anya ọgbọ nta nkwàdó ahụ n’ụlọomeiwu steeti ahụ n’ahọ 2023. A ga-echeta na Ayamelum bụ otu ọgbọ nta nkwàdó kwụụrụ onwe ya ma bụrụkwa okpuruọchịchị ime obodo nwere mpaghara atọ – Ayamelum North, Ayamelum South, na Ayamelum Central. A ga-echetakwa na Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor bụ onye sitere mpaghara Ayamelum North, ma bụrụkwa onye nọ