Posts

Showing posts with the label Grand Cereals

Ụlọọrụ Grand Cereals ejirila ihe erimeri kwàdo gọọmenti Anambra

Ụlọọrụ Grand Cereals nọrọ na nso nso a wee jiri ihe erimeridị iche iche wee kwàdo gọọmenti steeti Anambra iji nweta mmeri n’agha ahụ ọna-ebu megide ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ.   Ihe dị iche iche ụlọọrụahụ butere gụnyèrè mmanụ e ji esi nri, igbe ihe ọñụñụ ‘corn flakes’ karịrị narịabụọ na iri ise, tinyere akpati àkwá karịrị narị ise.  Oge ọ na-enyefe ihendị ahụ n’aka gọọmenti n’Awka n’aha ụlọọrụ ahụ, onye mere nke ahụ, bụ Maazị EnoBrown kwupụtara na e wezuga ọkpụkpọ òkù gọọmenti Anambra kpọrọ maka nkwàdo ọhanezena ụlọọrụ dị iche iche, na ihe ọzọ kpaliri ha inye ya bụ onyinye nkwàdo bụ makaetu gọọmenti na ụmụafọ steeti ahụ sigoro kwàdo ma na-emekwata ụlọọrụ ahụ mmakemgbe otu ahọ gara aga ọ nọgoro na ya bụ steeti.   O kwere nkwa na ụlọọrụahụ ga-aga n’ihu ịkwàdò gọọmenti n’agha esepughị aka ahụ ọ na-ebu megide mgbasaọrịa nje korona n’ime steeti ahụ, ma kpọkuziekwa ọchịchị steeti ahụ ka o jisieike na nke ahụ, iji hụ na ya bụ ajọ ọrịa agbasàghị maọbụ mee mkpamkpa na steetiahụ dịka ọ dị