Obianọ eguzobela òtù nhazi maka ụlọ oriri na nkwari Tulip
GỌVANỌ Willie Obianọ eguzobela òtù nhazi nke mmadụ iteghete mejuputara, maka ụlọ nkwari akụ Golden Tulip dị n’Agụlụ na steeti Anambra. Ka ọ na-eguzobe otu nhazi ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwara ha dịka ndị e hiri asaa naabọ n’anya wee họpụta n’ihi na gọọmenti ya chọrọ inweta nke kacha mma n’ihe ọbụla ọ na-eme ma kọwaa na ya nwere ezi olile anya na mmadụ ndị ahụ ga-ewebata ezi ọgụgụ isi ha na amalihe ha nwere iji mee ka nhazi ụlọ oriri ahụ bụrụ ịgba. Ọ kọwara na ọrụ ngo ụlọ oriri ahụ bụ nke malitere n’aka onye nyefere ya ọkwa ọchịchị bụ Mazị Peter Obi, bụkwa nke ọ rụrụ nanị ihe ruru pasent iri, wee ruo mgbe ya onwe batazịrị n’ọkwa ọchịchị wee rụchapụ pasent iri iteghete fọrọ afọ. Ka ọ na-akọwa na ọchịchị ya akwụchaala ụgwọ nile a ga-eji wee dozisie ime ụlọ nkwari akụ ahụ, Gọvanọ Obianọ kpọkuru ma dụọ ndị ahụ ka ha malite ọrụ ozigbo ozigbo ma werekwa ezi ọgụgụ isi ha nwere wee rụpụta ntụkwasị obi e nwere n’ebe ha nọ nakwa ihe a na-atụ anya n’aka ha. Otu mmadụ iteghete ahụ nke onyeisi oche ya