Posts

Showing posts with the label Gilbert Ezenagu

N'Ebenator, Ezenagu ekesàárala ndị mmadụ akpa osikapa

ONYE na-etinye ọchị n’ihu nwaogbenye na-etinye ọchị n’ihu chi kere nwaogbenye.   N’ịgbaso nke a, otu nwoke ọrụ obi ebere na-echu ụra, bụ Maazị Gilbert Ezenagu etinyela ọchị n’ihu ọtụtụ mmadụ site n’iji akpa osikapa wee kwàdó mmadụ ruru narị atọ n’ọnụọgụgụ, bụ ndị ọnọdụ dịịrị añaa, n’obodo ya bụ Ebenator, n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra.   Ọ nọkwara na mmemme ahụ wee kesàára ndị ahụ ego iji goro ihe ha ga-eji wee hazie ya bụ nri, ka erimeri wee bụrụ mkpori mkpori.   N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, Maazị Ezenagụ kọwara na mmadụ inyere onye ọnọdụ dịịrị añaa aka bụ ihe na-atọ Chineke ụtọ nke ukwuu, ma na-adọtakwa ngọzị na ihuọma Ya, tinyere ọtụtụ ezi ihe ndị ọzọ na Chineke na-emere onye dị etu ahụ, maka na Ọ bụ Ya bụ Onye na-akwụ ụgwọọrụ.   Dịka ọ na-akọ akụkọ ụwa banyere ihe Chineke meere ya na etu O siri gọzie ya, o mere ka a mara na ọ mụtara ịrụ ọrụ obi ebere na inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka site n’aka onyeisi ụlọụka ‘Synagogue Church of All Nations’ ,