Posts

Showing posts with the label Gbanjọ

Gbanjọ!! Lagos ereela ụgbọala 44 dara iwu okporoụzọ

ỤLỌỌRỤ gbanụgbanụ, ‘The Lagos State Task Force on Environment and Special Offences’ erefuola (auction) ụgbọala iri anọ na anọ nke ndị nwe  ha dara iwu okporoụzọ site n’ịgba ebe ha ekwesịghị ịgba (one-way), na mpaghara steeti ahụ dị iche iche.   Onye okwuputaokwu ọrụ gbanụgbanụ ahụ, Adebayo Taofiq gwara ndịntaakụkọ oge a na-erefu ụgbọala ndị ahụ n’Alausa, Ikeja na ya bụ amụma abụghị ntaramahụahụ kama ọ bụ inye ntụziaka otu e kwesịrị ime ihe. Taofiq kwuru na ndị ahụ dara iwu njem okporoụzọ bụ ndị adịrịla na mbụ kpụpụ ụlọ  ngagharị (mobile court) steeti Lagos ebe ụlọikpe mara ha ikpe ma tinyezie ụgbọala ndị ahụ n’aka gọọmenti steeti ahụ.   Otu o sila dị, ọ gara n’ihu kwuo na dịka a hapụụrụ gọọmenti ụgbọala ndị ahụ na iwu kwuru na a ga-erefusị ha mana ha ga-anata ikike site n’aka ụlọikpe; nke ha mekwara ma nweta. O kwuru sị; “Ka nke ahụ gachara, anyị gbasara ozi ma mee ka ndị mmadụ mata, ọ kachasi ndị nwe ụgbọala ndị ahụ, ka ha bịa taa maka irefu ụgbọala ndị ahụ.”   Taofiq kọwara na ọ dị m