GOGAN akpọọla oriri maka nturu ugo Buharị n'Anambra
ÒTÙ ‘Good Governors Ambassadors of Nigeria’ (GOGAN) emeela oke oriri na ọñụñụ dara ụda maka nturu ugo onyeisi ala Nigeria bụ Muhammadụ Buharị na nhọpụta izugbe ahụ e mere n’abali iri abụọ na atọ nke ọnwa Febrụwarị nso nso a. N’okwu ya na mmemme ahụ, onye chikọbara ya bụ oriri na ọñụñụ ma bụrụkwa onyeisi otu GOGAN, bụ Maazị Johnobosco Ọnụnkwọ kọwara ya bụ nturu ugo Buharị dịka nturu ugo nke ụmụafọ ala Nigeria niile n’izùgbe, ma kwuo na nke ahụ bụ nnọọ ntọpụ n’agbụ nye ụmụafọ Nigeria nke ugboro abụọ. O mere ka a mara na ọ bụ Chineke nna jiri aka ya wee guzobe Buharị n’oche site n’inye ya mmeri nke ugboro abụọ ahụ, iji wee chịkwuo ala Nigeria afọ anọ ọzọ, ma sị na nke ahụ kwesiri ịbụ obi añụrị na ihe oke oriri na ọñụñụ nyere onye ọbụla bụ ezi nwaafọ ala Nigeria. Maazị Ọnụnkwọ gara n’ihu kpọpụtasịa ụfọdụ n’ime ihe dị iche iche onyeisi ala Buharị meputagoro kemgbe afọ ole na ole ọ nọgoro n’ọkwa, nke gụnyere itute na inwògharị ọnọdụ akụnụba ala Nigeria, ibu agha megide mpụ, arụrụ ala na ịmaz